Ya mere ha siri Ya nri-anyasi n'ebe ahu: Mata nēje kwa ozi; ma Lazarọs bu otù onye n'etiti ndi Ya na ha nọduru na nri. Ya mere Meri were manu-otite ezi nard, di oké ọnu-ahia nke-uku, nke ọtùtù-ya ruru otù pound, te ukwu Jisus abua, were kwa agiri-isi-ya hicha ukwu-Ya: ísì manu-otite ahu we juputa ulo ahu. Ma Judas Iskariot, otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya, nke gaje irara Ya nye, si, N'ìhi gini ka anēreghi manu-otite a ọgu shilling iri na ise, were ya nye ndi-ob͕eye? Ma nka ka o kwuru, ọ bughi n'ihi na ọ kpọrọ ndi-ob͕eye ihe; kama n'ihi na ọ bu onye-ori, na ebe o ji àkpà-ego, ọ nēwepu ihe anētiye nime ya. Ya mere Jisus siri, Rapu nwanyi a ka o we debe ya rue ubọchi olìlìm. N'ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n'etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.
Gụọ JỌN 12
Geere nke a ntị JỌN 12
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 12:2-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị