Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 12:12-28

JỌN 12:12-28 IGBOB

N'echi-ya oké ìgwè madu nke biara ememe ahu, mb͕e ha nuru na Jisus nābia Jerusalem, ha chiri igu nkwu, pua izute Ya, we nēti nkpu, si, Hosanna: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi, bú Eze nke Israel. Ma mb͕e Jisus chọtasiri otù nwa-inyinya-ibu, Ọ nọkwasi ya; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Atula egwu, ada Zaion: le, Eze-gi nābia, nānọkwasi nwa inyinya-ibu. Ihe ndia ndi nēso uzọ-Ya amaghi na mbu: kama mb͕e enyereri Jisus otuto, mb͕e ahu ka ha chetara na edereri ihe ndia bayere Ya n'akwukwọ nsọ, na ha me-kwa-ra Ya-ri ihe ndia. Ya mere ìgwè madu ahu ndi ha na Ya nọ mb͕e O siri n'ílì kpọputa Lazarọs, me kwa ka o si na ndi nwuru anwu bilie, ha nāb͕a àmà. Ọ bu kwa n'ihi nka ka ìgwè madu ahu puru izute Ya, n'ihi na ha nuru na O mereri ihe-iriba-ama nka. Ya mere ndi-Farisi siritara onwe-ha, Lenu na okwu-unu abaghi n'ihe: le, uwa ejesowo Ya n'azu. Ma ndi-Grik ufọdu di n'etiti ndi nārigo ka ha kpọ isi ala nye Chineke n'ememe ahu: ya mere madu ndia biakutere Filip, nke bu onye Betsaida nke Galili, ha we kpere ya, si, Onye-nwe-ayi, ayi nāchọ ihu Jisus. Filip bia gwa Andru: Andru we bia, ya na Filip, ha we gwa Jisus. Jisus we za ha, si, Oge hour abiawo, ka ewe nye Nwa nke madu otuto. N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na nkpuru ọka adaghi n'ala we nwua, nání ya onwe-ya nānọgide; ma ọ buru na ọ nwuru, ọ mia ọtutu nkpuru. Onye nāhu ndu-ya n'anya nētufu ya; onye nākpọ kwa ndu-ya asì n'uwa nka gēdebe ya rue ndu ebighi-ebi. Ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya som; ebe Mu onwem nọ kwa, n'ebe ahu ka onye nējerem ozi gānọ kwa: ọ buru na onye ọ bula nējerem ozi, ya ka Nnam gāsọpuru. Ub͕u a ka nkpuru-obim nālọ miri; gini ka M'gēkwu kwa? Nna, zọputam n'oge hour nka. Ma n'ihi nka ka M'biaruru oge hour nka. Nna, nye aha-Gi otuto. Ya mere otù olu sitere n'elu-igwe da, si, Enyerem ya otuto, M'gēnye kwa Ya otuto ọzọ.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara