Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 10:22-42

JỌN 10:22-42 IGBOB

Ma ememe icheta owuwu ulo uku Chineke ọhu ruru na Jerusalem: ọ bu mb͕e oyi; Jisus we nējeghari n'ulo uku Chineke n'ìbà Solomon. Ya mere ndi-Ju nọgidere Ya buruburu, we si Ya, Ì nākwuba nkpuru-obi-ayi n'elu rue ole mb͕e? Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, gwawa ayi. Jisus zara ha, si, Agwaram unu, ma unu adighi-ekwe: ọlu nke Mu onwem nālu n'aha Nnam, ndia nāb͕aram àmà. Ma unu onwe-unu adighi-ekwe, n'ihi na unu adighi nime aturu nkem. Aturu nkem nānu olum, Mu onwem ma-kwa-ra ha, ha nēsokwam: Mu onwem nēnye kwa ha ndu ebighi-ebi; ha agaghi-ala kwa n'iyì ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ọ dighi kwa onye ọ bula gānapu ha n'akam. Nnam, Nke nyeworom ha, bu Onye uku kachasi ihe nile; ọ dighi kwa onye ọ bula puru inapu ihe n'aka Nnam. Mu onwem na Nnam bu otù. Ndi-Ju tuturu nkume ọzọ ka ha tua Ya. Jisus zara ha, si Ọtutu ọlu ọma ka M'gosiri unu site na Nnam; n'ìhi aha ọlu gini nime ndia Ka unu nātum nkume? Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n'ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n'ihi nkwulu; n'ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke. Jisus zara ha, si, Èdeghi ya n'iwu-unu, si, Mu onwem siri, Chi ka unu bu? Ọ buru na Ọ kpọrọ ndi ahu chi, ndi okwu Chineke biaruru (apughi kwa imebi ihe edere n'akwukwọ nso), ùnu onwe-unu nēkwu okwu bayere Onye ahu Nnam doro nsọ zite kwa n'uwa, si, I nēkwulu Chineke; n'ihi na asim, Abum Ọkpara Chineke? Ọ buru na alughm ọlu Nnam, unu ekwelam. Ma ọ buru na aluam ha, ọbuná ma asi na unu ekweghi Mu onwem, nēkwerenu ọlum: ka unu we mara nāmagide kwa na Nnam di nimem, na Mu onwem di kwa nime Nnam. Ha we chọ kwa uzọ ijide Ya: O we pua n'aka-ha. O we je ọzọ gabiga n'ofè Jọdan rue ebe Jọn nēme baptism na mbu; O we n-ogide n'ebe ahu. Ọtutu madu we biakute Ya; ha nāsi kwa, N'ezie ọ dighi ihe-iriba-ama Jọn mere: ma ka ha ra, bú ihe Jọn kwuru bayere Onye a, bu ezi-okwu Ọtutu madu we kwere na Ya n'ebe ahu.