Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma; ama-kwa-ram aturu nkem, aturu nkem ma-kwa-ram, dika Nnam maram, dika Mu onwem ma-kwa-ra Nnam; anamatọb͕ọ kwa ndum n'ihi aturum. Aturu ọzọ ka M'nwe-kwa-ra, ndi nēsiteghi n'ogige-aturu nka: aghaghim iduta kwa ndi ahu, ha gānu kwa olum; otù ìgwè-aturu gādi kwa, otù Onye-ọzùzù-aturu. N'ihi nka ka Nnam nāhum n'anya, n'ihi na Mu onwem nātọb͕ọ ndum, ka M'we nara ya ọzọ. Ọ dighi onye ọ bula nānapum ya, kama Mu onwem nātọb͕ọ ya n'Onwem. Enwerem ike itọb͕ọ ya, enwe-kwa-ram ike inara ya ọzọ. Ihe a enyere n'iwu ka M'natara n'aka Nnam. Nkewa putara ọzọ n'etiti ndi-Ju n'ihi okwu ndia. Ọtutu nime ha we si, O nwere mọ ọjọ, anya adighi kwa Ya nma; gini mere unu nānu olu-Ya? Ndi ọzọ nāsi, Ndia abughi okwu onye mọ ọjọ ji. Mọ̀ ọjọ puru imeghe anya ndi kpuru ìsì? Ma ememe icheta owuwu ulo uku Chineke ọhu ruru na Jerusalem: ọ bu mb͕e oyi; Jisus we nējeghari n'ulo uku Chineke n'ìbà Solomon. Ya mere ndi-Ju nọgidere Ya buruburu, we si Ya, Ì nākwuba nkpuru-obi-ayi n'elu rue ole mb͕e? Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, gwawa ayi. Jisus zara ha, si, Agwaram unu, ma unu adighi-ekwe: ọlu nke Mu onwem nālu n'aha Nnam, ndia nāb͕aram àmà. Ma unu onwe-unu adighi-ekwe, n'ihi na unu adighi nime aturu nkem. Aturu nkem nānu olum, Mu onwem ma-kwa-ra ha, ha nēsokwam: Mu onwem nēnye kwa ha ndu ebighi-ebi; ha agaghi-ala kwa n'iyì ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ọ dighi kwa onye ọ bula gānapu ha n'akam. Nnam, Nke nyeworom ha, bu Onye uku kachasi ihe nile; ọ dighi kwa onye ọ bula puru inapu ihe n'aka Nnam. Mu onwem na Nnam bu otù.
Gụọ JỌN 10
Geere nke a ntị JỌN 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 10:14-30
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị