Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JỌN 10:1-21

JỌN 10:1-21 IGBOB

N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēsiteghi n'ọnu-uzọ ba n'ogige aturu, kama o si n'ebe ọzọ nārigo ibà, onye ahu bu onye-ori na onye nāpunara madu ihe. Ma onye si n'ọnu-uzọ ba bu onye nāzù aturu. Onye ahu ka onye-ọnu-uzọ nēmeghere uzọ; aturu nānu kwa olu-ya: ọ nākpọ kwa aturu nke aka ya n'aha, n'edupu kwa ha. Mb͕e ọ bula ọ chupuru aturu nke aka ya nile, ọ nāga n'iru ha, aturu ahu nēso kwa ya: n'ihi na ha matara olu-ya. Ma ha agaghi-eso ọbìa ma-ọli, kama ha gāb͕anari ya: n'ihi na ha amataghi olu ndi-ọbìa. Ilu a ka Jisus turu ha: ma ha amaghi ihe ha bu, bú okwu Ọ nāgwa ha. Ya mere Jisus siri ha ọzọ, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mu onwem bu ọnu-uzọ nke aturu. Ka ha ra, bú ndi nile burum uzọ bia, ha bu ndi-ori na ndi nāpunara madu ihe: ma aturu ahu anughi olu-ha. Mu onwem bu ọnu-uzọ ahu: ọ buru na onye ọ bula esi na Mu ba, agāzọputa ya, ọ ganābata kwa nāpu kwa, nāhu kwa nri ọ gāta. Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n'iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè. Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma: onye-ọzùzù-aturu ọma nātọb͕ọ ndu-ya n'ihi aturu-ya. Onye-ọlu egoro ego, nke nābughi kwa onye-ọzùzù-aturu, onye aturu nābughi nke aka ya, ọ nāhu agu ka ọ nābia, o we rapu aturu, b͕alaga, agu we nwude ha, chusa kwa ha: n'ihi na ọ bu onye-ọlu egoro ego, ọ kpọghi kwa aturu ahu ihe. Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma; ama-kwa-ram aturu nkem, aturu nkem ma-kwa-ram, dika Nnam maram, dika Mu onwem ma-kwa-ra Nnam; anamatọb͕ọ kwa ndum n'ihi aturum. Aturu ọzọ ka M'nwe-kwa-ra, ndi nēsiteghi n'ogige-aturu nka: aghaghim iduta kwa ndi ahu, ha gānu kwa olum; otù ìgwè-aturu gādi kwa, otù Onye-ọzùzù-aturu. N'ihi nka ka Nnam nāhum n'anya, n'ihi na Mu onwem nātọb͕ọ ndum, ka M'we nara ya ọzọ. Ọ dighi onye ọ bula nānapum ya, kama Mu onwem nātọb͕ọ ya n'Onwem. Enwerem ike itọb͕ọ ya, enwe-kwa-ram ike inara ya ọzọ. Ihe a enyere n'iwu ka M'natara n'aka Nnam. Nkewa putara ọzọ n'etiti ndi-Ju n'ihi okwu ndia. Ọtutu nime ha we si, O nwere mọ ọjọ, anya adighi kwa Ya nma; gini mere unu nānu olu-Ya? Ndi ọzọ nāsi, Ndia abughi okwu onye mọ ọjọ ji. Mọ̀ ọjọ puru imeghe anya ndi kpuru ìsì?

Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara JỌN 10:1-21