Ọzọ n'echi-ya Jọn guzoro, ya na madu abua nime ndi nēso uzọ-ya; o we le Jisus anya ka Ọ nējeghari, ọ si, Le, Nwa-aturu Chineke! Madu abua ahu ndi nēso uzọ-ya we nu ka ọ nēkwu, ha we so Jisus. Jisus we chigharia, kiri ha ka ha nēso Ya, Ọ si ha, Gini ka unu nāchọ? Ha we si Ya, Rabai (nke isi-ya bu, ma asugharia ya, Onye-ozizí), òle ebe I bi? Ọ si ha, Bianu, unu gāhu kwa. Ya mere ha biara hu ebe O biri; ha na Ya we nọgide ubọchi ahu; ọ di ka oge hour nke-iri. Otù nime madu abua ahu ndi nuru okwu si n'ọnu Jọn puta, ndi so-kwa-ra Ya, bu Andru, nwa-nne Saimon. Onye ahu buru uzọ chọta nwa-nne nke aka ya, bú Saimon, si ya, Ayi ahuwo Mesaia-ayi (nke bu, ma asugharia ya, Kraist). O duru ya biakute Jisus. Jisus lere ya anya, si, Gi onwe-gi bu Saimon nwa Jọn: agākpọ gi onwe-gi Kifas (nke bu Pita, ma asugharia ya).
Gụọ JỌN 1
Geere nke a ntị JỌN 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JỌN 1:35-42
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị