Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JEREMAIA 38

38
1Shefataia nwa Matan, na Gedalaia nwa Pashua, na Jukal nwa Shelemaia, na Pashua nwa Malkija, we nuru okwu nile nke Jeremaia nāgwa ndi Israel nile, si, 2Otú a ka Jehova siri, Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpukuru ndi Kaldea gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata, o we di ndu. 3Otú a ka Jehova siri, Aghaghi inye obodo a n'aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ọ gēwere kwa ya. 4Ndi-isi we si eze, Biko, ka eme ka nwoke a nwua; n'ihi na ya onwe-ya nēme ka aka ndi-agha kuda, bú ndi fọduru n'obodo a, na aka ndi Israel nile, n'igwa ha okwu dika okwu ndia: n'ihi na nwoke a adighi-achọrọ ndi nka udo, kama ọ bu ihe ọjọ. 5Eze, bú Zedekaia, we si, Le, onye ahu di n'aka-unu: n'ihi na eze abughi onye puru ime ihe ọ bula megide unu. 6Ha we were Jeremaia, tubà ya n'olùlù Malkija nwa eze, nke di n'ogige ulo-nche: ha we chiri udọ̀ rada Jeremaia. Ma miri adighi n'olùlù ahu, ọ bu nání apiti: Jeremaia we mibe n'apiti ahu. 7Ebed-melek, bú onye Etiopia, onye bu onozi, nke nọ n'ulo eze, we nuru na ha tiyereri Jeremaia n'olùlù; ma eze nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Benjamin; 8Ebed-melek we si n'ulo eze puta, gwa eze okwu, si, 9Onye-nwem eze, ndikom ndia emewo ihe ọjọ n'ihe nile nke ha meworo Jeremaia, bú onye-amuma, onye ha tubàworo n'olùlù ahu; o we nọ n'ọnwu n'ọnọdu-ya n'ihi oké unwu: n'ihi na nri adighi kwa ọzọ n'obodo a. 10Eze we nye Ebed-melek, bú onye Etiopia, iwu, si, Si n'ebe a chiri orú ndikom na iri n'aka-gi, me ka Jeremaia, bú onye-amuma, si n'olùlù ahu rigoputa, tutu ọ nwua. 11Ebed-melek we chiri ndikom ahu n'aka-ya, ba n'ulo eze n'okpuru ulo-àkù, chiputa n'ebe ahu nkirika ákwà nke dọkara adọka na nkirika ákwà nke kara nká, o we chiri udọ̀ radara ha Jeremaia n'olùlù ahu. 12Ebed-melek, bú onye Etiopia, we si Jeremaia, Biko, tiye nkirika ákwà ndia nke dọkara adọka na nke kara nká n'okpuru nkpa-abu-gi abua n'okpuru udọ̀. Jeremaia we me otú a. 13Ha we chiri udọ̀ ahu dọgota Jeremaia, we me ka o si n'olùlù ahu rigoputa: Jeremaia we nọgide n'ogige ulo-nche ahu.
14Eze, bú Zedekaia, we ziga, kutara onwe-ya Jeremaia, bú onye-amuma, rue nbata nke-atọ nke di n'ulo Jehova: eze we si Jeremaia, Mu onwem gaje iju gi otù ihe; ezonarilam ihe ọ bula. 15Jeremaia we si Zedekaia, Mb͕e m'gēgosi gi, ì gaghi-eme ka m'nwua n'ezie? ọzọ, mb͕e m'gādu gi ọdu, i gaghi-egem nti. 16Eze, bú Zedekaia, we ṅuara Jeremaia iyi na nzuzo, si, Jehova nādi ndu, bú Onye ahu nke nyere ayi ndu a, m'gaghi-eme ka i nwua ma-ọli, m'gaghi-enye kwa gi ma-ọli n'aka ndikom ndia ndi nāchọ ndu-gi. 17Jeremaia we si Zedekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, siri: Ọ buru na i gāpukuru ndi-isi eze Babilon n'ezie, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu, agaghi-esure kwa obodo a n'ọku; i gādi kwa ndu, gi onwe-gi na ulo-gi: 18ma ọ buru na i pukughi ndi-isi eze Babilon, agēnye kwa obodo a n'aka ndi Kaldea, ha gēsure kwa ya n'ọku, gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha. 19Eze, bú Zedekaia, we si Jeremaia, Mu onwem nātu egwu ndi-Ju ndi dakuruworo ndi Kaldea, na ha gēnyem n'aka-ha, ha ewe kwam emò. 20Jeremaia we si, Ha agaghi-enye gi n'aka-ha. Biko, ge nti olu Jehova, n'ihe nke mu onwem nāgwa gi: o we diri gi nma, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu. 21Ma ọ buru na gi onwe-gi aju na i gaghi-apu, nka bu okwu nke Jehova meworo ka m'hu: 22Le, ndinyom ahu nile ndi fọduru n'ulo eze Juda gābu ndi emeworo ka ha pukuru ndi-isi eze Babilon, ndinyom ahu ganāsi kwa, Ndi gi na ha di n'udo akpaliwo gi, we nwe ike n'aru gi: ukwu-gi abua emiwo n'apiti, ha we laghachi azu. 23Ọ bu kwa ndinyom-i nile na umu-gi ka ha ganēme ka ha pukuru ndi Kaldea: gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha, kama aka eze Babilon gējide gi: ọ bu kwa obodo a ka i gēsure n'ọku. 24Zedekaia we si Jeremaia, Ekwela ka onye ọ bula mara okwu ndia, i gaghi-anwu kwa. 25Ma mb͕e ndi-isi gānu na mu na gi ekwuwo okwu, ha we biakute gi, si gi, Biko, gosi ayi ihe i gwaworo eze; ezonarila ayi ya, ayi agaghi-eme kwa ka i nwua: gosi kwa ayi ihe eze gwara gi: 26i gāsi kwa ha, Mu onwem nēme ka aririọ-amaram da n'iru eze, ka ọ ghara ime ka m'laghachi n'ulo Jonatan, inwu n'ebe ahu. 27Ndi-isi nile we biakute Jeremaia, jua ya: o we gosi ha dika okwu ndia nile si di nke eze nyere ya n'iwu. Ha we debe ọnu-ha du, rapu ya; n'ihi na anughi okwu ahu. 28Jeremaia we nọgide n'ogige ulo-nche rue ubọchi ewere Jerusalem. O rue, mb͕e ewere Jerusalem,

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

JEREMAIA 38: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye