JEREMAIA 35
35
1Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site Jehova n'ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si, 2Je n'ulo ndi Rikab, gwa ha okwu, me ka ha bata n'ulo Jehova, n'otù n'ime-ulo-ya, me ka ha ṅua manya-vine. 3M'we kuru Jeazanaia nwa Jeremaia, nwa Habazinaia, na umu-nne-ya, na umu-ya ndikom nile, na ulo nile nke ndi Rikab; 4m'we me ka ha bata n'ulo Jehova, n'ime-ulo umu Henan nwa Igdalaia, bú onye nke Chineke, nke di n'akuku ime-ulo ndi-isi, nke di n'elu ime-ulo Maaseia nwa Shalum, bú onye-nche nke nbata-uzọ: 5M'we che n'iru umu ulo ndi Rikab ọkwa ufọdu juputara na manya-vine na iko ufọdu, m'we si ha, Ṅuanu manya-vine. 6Ha we si, Ayi agaghi-aṅu manya-vine: n'ihi na Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, nyere ayi iwu, si, Unu aṅula manya-vine, unu onwe-unu, na umu-unu, rue mb͕e ebighi-ebi: 7unu ewu-kwa-la ulo, unu agha-kwa-la nkpuru, unu aku-kwa-la ubi-vine, unu enwe-kwa-la ihe ndia: kama ọ bu n'ulo-ikwū ka unu gēbi ubọchi nile nke unu; ka unu we di ndu ọtutu ubọchi n'elu ala ahu ebe unu onwe-unu bu ndi-ọbìa. 8Ayi we ge nti olu Jonadab nwa Rikab, bú nna-ayi, n'ihe nile nke o nyere ayi n'iwu, ighara iṅu manya-vine ubọchi nile ayi, ayi onwe-ayi, na ndinyom-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom; 9na ighara iwu ulo ka ayi we biri nime ha: ọ dighi kwa ubi-vine, ma-ọbu ubi, ma-ọbu nkpuru-ọghigha ayi nwere: 10ayi we biri n'ulo-ikwū, we ge nti, me dika ihe nile si di nke Jonadab, bú nna-ayi, nyere ayi n'iwu. 11O rue, mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, rigotara n'ala nka, na ayi siri, Bianu, ka ayi ba na Jerusalem n'ihi usu-ndi-agha nke ndi Kaldea, na n'ihi usu-ndi-agha nke Siria; ayi we biri na Jerusalem.
12Okwu Jehova we rue Jeremaia nti, si, 13Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Je, si ndi Juda, si kwa ndi bi na Jerusalem, Ùnu agaghi-anara idọ-aka-na-nti ige nti okwum nile? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. 14Emewo ka okwu nile nke Jonadab nwa Rikab guzosie ike, bú nke o nyere umu-ya n'iwu, ka ha ghara iṅu manya-vine, ha aṅughi kwa manya-vine rue ta, n'ihi na ha anuwo ihe nke nna-ha nyere n'iwu: ma Mu onwem agwawo unu okwu, nēbili n'isi-ututu nēkwu; ma unu egeghm nti. 15M'we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha, si, Biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me-kwa-nu ka omume nile unu di nma, unu ejeso-kwa-la chi ọzọ ifè ha, biri-kwa-nu n'ala nka nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà: ma unu atọghi nti-unu n'ala, unu egeghkwam nti. 16N'ihi na umu Jonadab nwa Rikab emewo ka ihe ahu nna-ha nyere n'iwu guzosie ike, bú nke o nyere ha n'iwu, ma ndi nka egeghm nti; 17n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ ahu nile biakute Juda, biakute kwa ndi nile bi na Jerusalem, bú nke M'kwuworo megide ha: n'ihi na agwawom ha okwu, ma ha anughi; M'we kpọ ha òkù, ma ha azaghi. 18Jeremaia we si ulo ndi Rikab, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N'ihi na unu egewo nti ihe Jonadab, bú nna-unu, nyere n'iwu, unu we debe ihe nile o nyere n'iwu, unu we me dika ihe nile si di nke o nyere unu n'iwu; 19n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Agaghi-ebipu n'ulo Jonadab nwa Rikab onye nwe iguzo n'irum ubọchi nile.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
JEREMAIA 35: IGBOB
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.