Ma ub͕u a n'ihi nka ka Jehova, bú Chineke nke Israel, ji kwue okwu di otú a bayere obodo a, nke unu onwe-unu nāsi, Enyewo ya n'aka eze Babilon site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: si, Le, M'gaje ichikọputa ha n'ala nile, ebe M'chugaworo ha n'iwem, na n'ọnumam, na n'oké iwe di uku; M'gēme kwa ka ha lata n'ebe a, me kwa ka ha biri na ntukwasi-obi: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke: M'gēnye kwa ha otù obi na otù uzọ, itu egwu Mu onwem ubọchi nile; ka o we diri ha, di-kwa-ra umu-ha ndi gānọchi ha, nma: Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gaghi-esi n'iso ha ime ha nma laghachi azu; ma egwum ka M'gētiye n'obi-ha, ka ha we ghara isi n'ebe M'nọ wezuga onwe-ha. Obi gātọkwam utọ n'aru ha ime ha nma, M'gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n'ala nka n'ezie dika osisi.
Gụọ JEREMAIA 32
Geere nke a ntị JEREMAIA 32
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JEREMAIA 32:36-41
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị