Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 9

9
1Abimelek nwa Jerubeal we jerue Shekem, jekuru umu-nne nne-ya, gwa ha okwu, gwa kwa ab͕uru nile nke ulo nna nne-ya, si, 2Biko, kwuenu na nti ndi nile nwe Shekem, si, Òle nke diri unu nma? na ọgu ndikom atọ na iri, bú umu-ndikom nile nke Jerubeal, nāchi unu, ma-ọbu na otù nwoke nāchi unu? cheta-kwa-unu na ọkpukpu-unu na anu-aru-unu ka m'bu. 3Ume-nne nne-ya kwue okwu ndia nile bayere ya na nti ndi nile nwe Shekem: obi-ha we wezuga onwe-ha iso Abimelek; n'ihi na ha siri, Nwa-nne-ayi ka ọ bu. 4Ha we nye ya ọgu ọla-ọcha atọ na iri sitere n'ulo Beal-berit, nke Abimelek ji go ndikom efu ndi obi-ha nādighi adi n'otù ebe, ha we jeso ya. 5O we ba n'ulo nna-ya n'Ọfra, b͕ue umu-nne-ya, bú umu Jerubeal, ọgu madu atọ na iri, n'elu otù nkume: ma Jotam nwa Jerubeal nke-ntà fọduru; n'ihi na o zoro onwe-ya.
6Ndi nile nwe Shekem we chikọta onwe-ha, ha na ulo nile nke Milo, ha we je me Abimelek ka ọ buru eze, n'akuku osisi terebinth nke ogidi ahu nke di na Shekem. 7Ha we gosi ya Jotam, o we je guzo n'elu ugwu Geraizim, welie olu-ya, kpọ, si ha, Genum nti, unu ndi-nwe Shekem, ka Chineke we ge unu nti. 8Osisi jere eje ite otù onye manu ka ọ buru eze-ha; ha we si osisi olive, Buru eze-ayi. 9Osisi olive we si ha, M'gāgha manu nkem, bú nke ha ji sọpuru Chineke na madu nimem, je ifeghari n'elu osisi nile? 10Osisi nile we si osisi fig, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi. 11Osisi fig we si ha, M'gagha utọm na ezi ihe-ọmimim, je ifeghari n'elu osisi nile? 12Osisi nile we si osisi vine, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi. 13Osisi vine we si ha, M'gāgha manya ọhu nkem, bú nke nēme ka Chineke na madu ṅuria ọṅu, je ifeghari n'elu osisi nile? 14Osisi nile we si ogwu, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi. 15Ogwu we si osisi nile, Ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu ka unu onwe-unu nētem manu iburu unu eze, bianu, b͕abànu n'okpuru ndo nkem: ma ọ buru na ọ bughi n'ezi-okwu, ka ọku si n'ogwu puta, ripia osisi cedar nile nke Lebanon. 16Ma ub͕u a, ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu na n'izu-okè ka unu meworo ihe a, na unu emewo Abimelek eze, ọ buru kwa na ọ bu ezi ihe ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ọ buru kwa na ọ bu dika nmeso aka-ya abua si di ka unu meworo ya; 17(n'ihi na nnam būru agha bayere unu, tufue ndu-ya n'iru ya, we naputa unu n'aka Midian: 18ma unu onwe-unu ebiliwo imegide ulo nnam ta, b͕u kwa umu-ya ndikom, bú ọgu ndikom atọ na iri, n'elu otù nkume, me kwa Abimelek, bú nwa orù-ya nwayi, eze ndi-nwe Shekem, n'ihi na nwa-nne-unu ka ọ bu;) 19ma ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu na n'izu-okè ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ta, ṅurianu ọṅu n'Abimelek, ka ọ ṅuria kwa nime unu, ọbuná ya onwe-ya: 20ma ọ buru na ọ bughi otú a, ka ọku si n'Abimelek puta, ripia ndi-nwe Shekem, na ulo Milo; ka ọku si kwa na ndi-nwe Shekem puta, si kwa n'ulo Milo puta, ripia Abimelek. 21Jotam we b͕alaga, b͕apu, jerue Bia, biri n'ebe ahu, n'ihi Abimelek, bú nwa-nne-ya.
22Abimelek we buru onye-isi Israel arọ atọ. 23Chinek we zite mọ ọjọ n'etiti Abimelek na ndi-nwe Shekem; ndi-nwe Shekem we ghọb͕ue Abimelek: 24ka ihe-ike emere ọgu umu-ndikom Jerubeal atọ na iri we bia, ka ewe tukwasi kwa ọbara-ha n'isi Abimelek, bú nwa-nne-ha, onye b͕uru ha, na n'isi ndi-nwe Shekem, ndi mere ka aka-ya abua di ike ib͕u umu-nne-ya. 25Ndi-nwe Shekem we do ndi nēruru ya nbì n'elu ugwu nile ha, ha we punara onye ọ bula nke nāgabiga n'uzọ ahu n'akuku ha ihe: ewe gosi Abimelek.
26Geal nwa Ebed we bia, ya na umu-nne-ya, ha we gabiga ba Shekem: ndi-nwe Shekem we tukwasi ya obi. 27Ha we pua ba n'ubi, ghọ nkpuru ubi-vine nile ha, zọcha nkpuru-vine, me ememe otuto, ba n'ulo chi-ha, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, kọcha Abimelek. 28Geal nwa Ebed we si, Ònye bu Abimelek, ònye bu kwa Shekem, na ayi gēfè ya òfùfè? ọ̀ bughi nwa Jerubeal? Zebul kwa, ọ̀ bughi onye-nlekọta ihe-ya? fènu ndikom Hemoa, bú nna Shekem, òfùfè: ma gini mere ayi onwe-ayi nēfè ya òfùfè? 29Ma ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ndi nka nọ n'akam! m'gēwezuga kwa Abimelek. O we si Abimelek, Me ka usu-ndi-agha-gi ba uba, gi puta kwa. 30Zebul, bú onye-isi obodo ahu, we nu okwu nile nke Geal nwa Ebed, iwe-ya we di ọku. 31O we zigara Abimelek ndi-ozi n'aghughọ, si, Le, Geal nwa Ebed na umu-nne-ya nābà nime Shekem; ma, le, ha nākpab͕u obodo a imegide gi. 32Ma ub͕u a, bilie n'abali, gi onwe-gi na ndi gi na ha nọ, ru kwa nbì n'ọhia: 33ọ gēru kwa, n'ututu, mb͕e anyanwu nāwa, na i gēbili n'isi-ututu, made imegide obodo: ma, le, mb͕e ya onwe-ya na ndi ya na ha nọ nāpukute gi, i gēme kwa ha dika aka-gi gāchọta.
34Abimelek we bilie n'abali, ya na ndi nile ndi soro ya, ha we rue nbì megide Shekem n'usu anọ. 35Geal nwa Ebed we pua, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo: Abimelek we si n'oruru-nbì ahu bilie, ya na ndi soro ya. 36Geal we hu ndi ahu, we si Zebul, Le, ndi ufọdu si n'elu ugwu nārida. Zebul we si ya, Ọ bu onyinyo ugwu ka gi onwe-gi nāhu dika ndikom. 37Geal we kwu ọzọ, si, Le, ndi ufọdu si n'elu-ala nke ala nārida, otù usu si kwa n'uzọ osisi terebinth nke Meonenim nābia. 38Zebul we si ya, Òle ebe ọnu-gi ub͕u a, na i nāsi, Ònye bu Abimelek, na ayi gēfè ya òfùfè? Nkà abughi ndi nke i juworo? biko, pua ub͕u a, buso ha agha. 39Geal we pua ga n'iru ndi-nwe Shekem, buso Abimelek agha. 40Abimelek we chua ya, ọ we b͕alaga n'iru ya, ọtutu madu we da meru aru, rue oghere ọnu-uzọ-ama. 41Abimelek we nọdu n'Aruma: Zebul we chupu Geal na umu-nne-ya, ka ha we ghara ibiri na Shekem. 42O rue n'echi-ya, na ndi ahu puru ba n'ọhia; ha we gosi Abimelek. 43O we chiri ndi-ya, kè ha usu atọ, rue nbì n'ọhia; ọ hu, ma, le, ndi ahu si n'obodo ahu nāputa; o we bilie imegide ha, tib͕ue ha. 44Abimelek na usu ndi soro ya we made, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo: usu abua ahu we made imegide ndi nile nọ n'ọhia, tib͕ue ha. 45Abimelek we buso obodo ahu agha ubọchi ahu nile; o we were obodo ahu, b͕ue ndi nọ nime ya: ọ kwatue obodo ahu, ghasa ya nnú.
46Ndi nile nwe ulo-elu Shekem we nu ya, ba n'ulo kachasi elu nke ulo El-berit. 47Ewe gosi Abimelek na ndi nile nwe ulo-elu Shekem achikọtawo onwe-ha. 48Abimelek we rigo n'ugwu Zalmon, ya onwe-ya na ndi nile soro ya; Abimelek we chiri anyu-ike-ha n'aka-ya, o we b͕utue alaka osisi, welie ya, tukwasi ya n'ubu-ya: ọ si ndi soro ya, Ihe unu huworom ka m'mere, menu ngwa, menu dika m'meworo. 49Ndi ahu nile we b͕utu kwa, nwoke ọ bula alaka-ya, ha we jeso Abimelek, tukwasi ha n'ulo ahu kachasi elu, su ulo kachasi elu ahu ọku n'isi ha; ndikom nile nke ulo-elu Shekem we nwu kwa, bú ihe ra ka nnù ndikom na ndinyom abua na ọgu iri.
50Abimelek we jerue Tibez, ma ulo-ikwū-ya megide Tibez, were ya. 51Ma otù ulo-elu siri ike di n'etiti obodo ahu, ndikom nile na ndinyom nile na ndi nile nwe obodo ahu we b͕alaga n'ebe ahu, mechibido onwe-ha uzọ, rigo n'elu ulo-elu ahu. 52Abimelek we biarue ulo-elu ahu, buso ya agha, jerue nso ọnu-uzọ ulo-elu ahu iwere ọku sure ya. 53Otù nwayi we tua aka-nkume n'isi Abimelek, tuwa eju-isi-ya. 54O we me ngwa kpọ nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, si ya, Miputa mma-agha-gi, me ka m'nwua, ka ha we ghara ikwu okwu bayerem, si, Nwayi b͕uru ya. Nwa-okorọbia-ya we mapue ya, ọ nwua. 55Ndikom Israel we hu na Abimelek anwuruwo, ha we la, nwoke ọ bula n'ebe nke ya. 56Chineke we nyeghachi ihe ọjọ Abimelek, nke o mere nna-ya, n'ib͕u ọgu umu-nne-ya atọ na iri: 57ọ bu kwa ihe ọjọ nile nke ndikom Shekem ka Chineke nyeghachiri n'isi-ha: nkọcha Jotam nwa Jerubeal we biakwasi ha.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NDI-IKPE 9: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara