Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 6:28-40

NDI-IKPE 6:28-40 IGBOB

Ndikom obodo ahu we bilie n'isi-ututu, ma, le, akwaturu ebe-ichu-àjà Beal, b͕utu kwa Ashera nke di n'akuku ya, sure kwa oke-ehi nke-abua ahu n'elu ebe-ichu-àjà nke ewuru. Ha we sirita onwe-ha, Ònye mere ihe a? Ha we jua ajuju, chọ kwa, si, Gideon nwa Joash emewo ihe a. Ndikom obodo ahu we si Joash, Me ka nwa-gi puta, ka ọ nwua: n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà Beal, na n'ihi na o b͕utuwo Ashera nke di n'akuku ya. Joash we si ndi nile nke guzoro megide ya, Unu onwe-unu, ùnu gēkpere Beal ọnu-ya? ma-ọbu unu onwe-unu, ùnu gāzọputa ya? Onye nke gēkpere ya ọnu-ya, ka eme ka ọ nwua: rapu ya rue ututu; ọ buru na chi ka ọ bu, ya kpere onwe-ya ọnu-ya, n'ihi na akwatuwo ebe-ichu-àjà-ya. Ọ we kpọ ya Jerubeal n'ubọchi ahu, si, Ka Beal kpegide ya, n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà-ya. Ndi Midian nile na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu we chikọta onwe-ha, gabiga, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Jezreel. Mọ nke Jehova we were Gideon kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we fùa opì-ike; Abieza we kpọkọta onwe-ha n'azu ya. O we ziga ndi-ozi nime Manase nile; ha onwe-ha kpọkọta-kwa-ra onwe-ha n'azu ya: o we ziga ndi-ozi nime Asha, na nime Zebulun, na nime Naftali; ha we rigo izute ha. Gideon we si Chineke, Ọ buru na I nēsi n'akam zọputa Israel, dika I kwuworo, le, mu onwem nētiye aji-anu ebìri ebì n'ebe-nzọcha-ọka; ọ buru na igirigi adikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma ọkpukpọ-nku adikwasi n'ala nile buruburu, m'gāmara kwa na I gēsi n'akam zọputa Israel, dika I kwuworo. O we di otú a: o we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, pikọta aji-anu ebìri ebì ahu, hichapu igirigi n'aji-anu ebìri ebì ahu, ojuju ọkwa miri. Gideon we si Chineke, Ka iwe-Gi ghara idi ọku megidem, ka m'kwu kwa nání otù ub͕ò a: biko, ka m'were aji-anu ebìri ebì ahu nwa nání otù ub͕ò a; biko, ka ọkpukpọ-nku dikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma ka igiriri dikwasi n'ala nile buruburu. Chineke we me otú a n'abali ahu: ọkpukpọ-nku we dikwasi nání n'aji-anu ebìri ebì ahu, ma igirigi dikwasiri n'ala nile buruburu.