Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 6:11-24

NDI-IKPE 6:11-24 IGBOB

Mọ-ozi nke Jehova we bia, nọdu n'okpuru osisi terebinth ahu nke di n'Ọfra, nke Joash, bú onye Abieza, nwere: ma Gideon nwa-ya nēticha ọka wheat n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine, iwepu ya n'iru Midian. Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya, si ya, Jehova nọyere gi, gi dike bu dìnkpà. Gideon we si ya, Biko, onye-nwem, ọ buru na Jehova nọyere ayi, n'ìhi gini kwa ka ihe a nile dakwasiworo ayi? òle ebe kwa ka ihe-ebube-Ya nile di, nke nna-ayi-hà kọrọ ayi akukọ ha, si, Jehova, Ọ̀ meghi ka ayi si n'Ijipt rigota? ma ub͕u a Jehova arapuwo ayi, nye kwa ayi n'aka Midian. Jehova we che ya iru, si, Je n'ike-gi a, zọputa Israel n'aka Midian: èzigaghm i? Ọ si Ya, Biko, Onye-nwe-ayi, #M'gēji gini zọputa Israel? le, usu nnù ndikom abua na ọgu iri nkem bu nke nēnweghi ike nime Manase, mu onwem bu kwa onye pekasiri npe n'ulo nnam. Jehova we si ya, N'ihi na Mu na gi gānọ, i gētib͕u kwa Midian dika otù nwoke. Ọ si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, Gi me-kwa-ram ihe-iriba-ama na Gi onwe-gi nākpayerem uka. Biko, esila n'ebe a pua, rue mb͕e m'gābiakute Gi, weputa onyinyem inata iru-ọma, dọba ya n'iru Gi. Ọ si, Mu onwem gānọdu rue mb͕e i gābiaghachi. Gideon we ba n'ulo, dozie nwa-ewu, na achicha ekoghi-eko nke ephah utu ọka: o tiyere anu ahu nime nkata, tiye kwa ofè n'ite, weputa ya nye ya n'okpuru osisi terebinth ahu, we weta ya nso. Mọ-ozi nke Chineke we si ya, Were anu nka na achicha ekoghi-eko nka, dọba n'elu nkume a di elu, wusi kwa ofé. O me otú a. Mọ-ozi nke Jehova we setipu nsọtu nkpa-n'aka nke di n'aka-ya, metu anu ahu na achicha ekoghi-eko ahu; ọku we si na nkume ahu di elu rigo, ripia anu ahu na achicha ekoghi-eko; mọ-ozi nke Jehova we pua n'anya-ya. Gideon we hu na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu; Gideon we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ihi na ahuwom mọ-ozi nke Jehova iru n'iru. Jehova we si ya, Udo diri gi; atula egwu: i gaghi-anwu. Gideon we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọ ya Jehova-shalom: rue ta ọ digide n'Ọfra nke ndi Abieza.