Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 5

5
1Debora na Berak nwa Abinoam we bùa abù n'ubọchi ahu, si,
2N'ihi na ndi-ndú nēdu edu n'Israel,
N'ihi na ndi Israel were afọ-ofufo nye onwe-ha,
Gọzienu Jehova.
3Nurunu, ndi-eze; ṅanu nti, ndi-isi;
Mu onwem gābùku Jehova abù, ọbuná mu onwem;
M'gābùku Jehova, bú Chineke nke Israel, abù ọma.
4Jehova, mb͕e I siri na Sia puta,
Mb͕e I siri n'ọhia Edom zọ ije,
Ala mara jijiji, elu-igwe bu-kwa-ra miri,
Igwe-oji nile nke b͕ara ọchichiri bu-kwa-ra miri.
5Ugwu nile rudara dika miri n'iru Jehova,
Ọbuná Sainai ahu n'iru Jehova, bú Chineke nke Israel.
6N'ubọchi Shamga nwa Anat,
N'ubọchi Jael, okporo-uzọ nile ghara idi,
Ndi nēje ije n'uzọ we je n'okporo-uzọ b͕agọrọ ab͕agọ.
7Obodo ntà we ghara idi n'Israel, ha we ghara idi,
Rue mb͕e mu, bú Debora, biliri,
Rue mb͕e mu, bú nne n'Israel, biliri.
8Ha rọputara chi ọhu di iche iche;
Mb͕e ahu agha di n'ọnu-uzọ-ama nile:
Àhuru ọta ma-ọbu ube
N'etiti orú nnù madu uzọ ise n'Israel?
9Obim di n'ebe ndi-ònyé-ukpuru nke Israel nọ,
Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha n'etiti ndi Israel:
Gọzienu Jehova.
10Unu ndi inyinya-ibu ọcha nēbu,
Ndi nānọkwasi n'uwe-nwuda,
Unu na ndi nēje ije n'uzọ,
Tugharinu uche.
11N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri,
N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova,
Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel.
Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile.
12Teta, teta, Debora;
Teta, teta, kwue okwu abù:
Bilie, Berak, dọta usu ndi i dọtara n'agha n'agha, gi nwa Abinoam.
13Mb͕e ahu ndi fọduru nime ndi di ike nke-uku, bú ndi Israel, ridara;
Jehova ridara n'ihim imegide ndi-dike.
14Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n'Efraim rida;
Nēso gi n'azu, Benjamin, n'etiti umu-nna-gi.
Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida,
Ndi ji nka-n'aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida.
15Ndi-isi n'Isaka nọye-kwa-ra Debora;
Dika Isaka si di, otú a ka Berak di;
Na ndagwurugwu ka ezigara ya n'ukwu-ya abua.
Na miri-iyi nile nke Reuben
Ka oké nzube obi di.
16N'ìhi gini ka i nọduru n'etiti ogige-aturu-gi,
Inu ob͕ub͕u-ọ̀jà anēb͕uru ìgwè aturu?
Na miri-iyi nile nke Reuben
Ka oké nnyocha obi di.
17Gilead biri n'ofè Jọdan:
Dan kwa, n'ìhi gini ka ọ nọ n'ub͕o?
Asha nọduru n'ọnu-miri oké osimiri,
Ọ bu kwa n'akuku ọwara-miri-ya nile ka o nēbi.
18Zebulun bu ndi nyebigara ndu-ha rue ọnwu,
Naftali kwa, n'elu ebe nile di elu nke ọhia.
19Ndi-eze biara, bū agha;
Mb͕e ahu ndi-eze Kenean būru agha,
Nime Teanak n'akuku miri Megido:
Ọ dighi urù ego ha nara.
20N'elu-igwe ka ha si bū agha,
Kpakpando si n'uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha.
21Miri-iyi Kaishon bupuru ha,
Miri-iyi ochie ahu, bú miri-iyi Kaishon.
Nkpuru-obim, i nāzọda ike.
22Mb͕e ahu ka ukwu inyinya zọsiri ike
Site n'iwuli-elu ahu nile, bú iwuli-elu nke ihe nile ya di ike.
23Buanu Miroz ọnu, ka mọ-ozi nke Jehova siri,
Buanu ndi bi nime ya ọnu nke-uku;
N'ihi na ha abiaghi iyere Jehova aka,
Iyere Jehova aka imegide ndi-dike.
24Agāgọzi Jael kari ndinyom,
Bú nwunye Heba onye-Kenait,
Kari ndinyom n'ulo-ikwū ka agāgọzi ya.
25Miri ka Sisera riọrọ, miri-ara-ehi ka ọ nyere ya;
O weta nso ya miri-ara-ehi nke raru araru n'ọkwa ndi di ebube.
26Aka-ya ka ọ setiri na ǹtú,
Aka-nri-ya n'otùtù ndi nālu ọlu ike;
O were otùtù kpọ Sisera, ọ kpọrọ ya n'isi,
O we kpọpue ya, ǹtú ahu we bapue n'akuku egedege-iru-ya.
27N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da, tọb͕ọ:
N'ab͕ata ukwu-ya abua ka o ruru ala, da:
Ebe o ruru ala, n'ebe ahu ka ọ dara, la n'iyì.
28Na window-ya ka ọ lepuru anya, tie nkpu,
Bú nne Sisera, site n'oghere inara ifufe,
Gini mere ub͕o-ala-ya nānọ ọdù ibia?
Gini mere wheel nke ub͕ọ-ala-ya nile ji la azu?
29Ndi-isi-ya ndinyom ndi mara ihe nāza ya,
E, ya onwe-ya nēkwughachiri onwe-ya okwu-ọnu-ya nile,
30Hà achọtaghi? hà ekèghi ihe-nkwata?
Otù nwa-ab͕ọghọ, umu-ab͕ọghọ abua, gādiri nwoke ọ bula, n'isi n'isi;
Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji, diri Sisera,
Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma,
Bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma n'akuku abua, nke diri olu ndi akwatara?
31Otú a ka ndi-iro-Gi nile gāla n'iyi, Jehova:
Ma ndi nāhu Ya n'anya gādi ka anyanwu mb͕e ọ nāputa n'ike-ya.
Ala we di jū ọgu arọ abua.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NDI-IKPE 5: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara