Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 3

3
1Ma ndia bu mba ndi Jehova rapuru, iji ha nwa Israel, bú ndi nile nāmaghi agha nile nke Kenean; 2nání ka ọb͕ọ nile nke umu Israel we mara, izí ha agha, nání ndi nāmaghi ha na mb͕e gara aga; 3bú ndi-isi ise nke ndi Filistia, na ndi Kenean nile, na ndi Zaidon, na ndi-Haivait ndi bi n'ugwu Lebanon, site n'ugwu Beal-heamon rue nbata Hemat. 4Ha di kwa ka ewere ha nwa Israel, imara ma ha gānu ihe nile Jehova nyere n'iwu, nke O nyere ndi bu nna-ha n'iwu n'aka Moses. 5Umu Israel we biri n'etiti ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: 6ha we lutara onwe-ha umu-ha ndinyom na nwunye, were umu-ha ndinyom nye umu-ha ndikom, fè kwa chi nile ha òfùfè.
7Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova, chezọ Jehova, bú Chineke-ha, fè Bealim na Asherot. 8Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n'aka Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia; umu Israel we fè Kushan-rishataim òfùfè arọ asatọ. 9Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere umu Israel, ọ we zọputa ha, bú Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne ntà Keleb. 10Mọ nke Jehova we dikwasi ya, o we kpe Israel ikpe; ọ pua ibu agha, Jehova we nye Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia, n'aka-ya: aka-ya we di ike n'aru Kushan-rishataim. 11Ala ahu we di jū ọgu arọ abua. Ọtniel nwa Kenaz we nwua.
12Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova ọzọ: Jehova we me ka Eglon, bú eze Moab, di ike imegide Israel, n'ihi na ha emewo ihe ọjọ n'anya Jehova. 13O we chikọtara onwe-ya umu Amon na Amalek, je tib͕ue Israel, ha we nweta obodo nkwu ahu. 14Umu Israel we fè Eglon, bú eze Moab, òfùfè arọ iri na asatọ. 15Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere ha, bú Ihud nwa Gira, onye Benjamin, onye nēme aka-ekpe: umu Israel we si n'aka-ya zigara Eglon eze Moab onyinye-inata-iru-ọma. 16Ihud we mere onwe-ya mma-agha nke nwere ọnu abua, ogologo-ya bu otù cubit; o ke ya n'okpuru uwe-nwuda-ya n'apata-ukwu aka-nri ya. 17Ọ weta onyinye-inata-iru-ọma ahu nso Eglon eze Moab: ma Eglon bu nwoke mara abuba nke-uku. 18O rue, mb͕e o wetasiri onyinye-inata-iru-ọma ahu nso, na o zilagara ndi nēbu onyinye-inata-iru-ọma ahu. 19Ma ya onwe-ya si n'arusi apiri api ndi di na Gilgal laghachi, si, Okwu nzuzo ka m'nwere igwa gi, eze. Ọ si, Nọdunu du. Ndi nile ndi nēguzo ya buruburu we si n'ebe ọ nọ pua. 20Ihud we biakute ya; ma ya onwe-ya nānọdu nání ya n'ime-ulo-elu ọjuju-oyi nke o nwere. Ihud we si, Okwu Chineke ka m'nwere igwa gi. O we si n'oche-eze-ya bilie. 21Ihud we setipu aka-ekpe-ya, si n'apata-ukwu aka-nri ya were mma-agha ahu, ma ya n'afọ-ya: 22isi-mma we soro kwa iru-mma ba; abuba we b͕ochipu iru-mma, na ọ dọputaghi mma-agha ahu n'afọ-ya; o we pua n'otule-ya. 23Ihud we pua n'uzọ-nbata, mechibido ya ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu, kpachie ha. 24Ma mb͕e ya onwe-ya pusiri, ndi-orù-ya batara; ha we hu, ma, le, akpachiwo ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu; ha si, Ọ bu nání na o nēkpuchi ukwu-ya abua n'ime-ulo ọjuju-oyi ya. 25Ha we nēche rue mb͕e ihere mere ha: ma, le, o meghepughi ọnu-uzọ ime-ulo-elu ahu; ha we were nkpisi-ugodi, meghe ha: ma, le, onye-nwe-ha adawo n'ala nwua. 26Ihud we wepuga onwe-ya mb͕e ọ nāb͕agwoju ha anya, ya onwe-ya we gabiga arusi ahu apiri api, wepuga onwe-ya rue Seira. 27O rue, mb͕e ọ biara, na ọ fùru opì-ike n'ugwu Efraim, umu Israel we si n'ugwu ahu soro ya rida, ya onwe-ya we nọ n'iru ha. 28Ọ si ha, B͕asonum n'azu: n'ihi na Jehova enyewo ndi-iro-unu, bú ndi Moab, n'aka-unu. Ha we soro ya rida, were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzọ ije Moab, ha ekweghi kwa ka nwoke ọ bula gabiga. 29Ha we tib͕ue Moab na mb͕e ahu, ihe ra ka orú nnù madu na nnù ise, nwoke ọ bula nke buru ibù, na nwoke ọ bula bu dìnkpà; ọ dighi kwa nwoke ọ bula wepugara onwe-ya. 30Ewe me ka Moab ruru ala n'okpuru aka Israel n'ubọchi ahu. Ala ahu we di jū ọgu arọ anọ.
31Mb͕e ọ gasiri Shamga nwa Anat we di, nke were ndudu eji achu ehi tib͕ue ndi Filistia, nnù ndikom na ọgu iri: ya onwe-ya kwa, ọ zọputara Israel.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NDI-IKPE 3: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara