Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 20

20
1Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n'ebe Jehova nọ na Mizpa. 2Ndi-isi ndi Israel nile, bú ebo nile nke Israel, we guzo onwe-ha nime nkpọkọta ndi Chineke, orú nnù ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndi ji ukwu eje, ndi nāmiputa mma-agha. 3(Ma umu Benjamin nuru na umu Israel arigowo rue Mizpa.) Umu Israel we si, Kwuenu, ìhe ọjọ a si aṅa di? 4Nwoke ahu, bú onye Livai, di nwayi ahu nke eb͕uru eb͕u, we za, si, Ọ bu Gibea nke diri Benjamin ka m'biara, mu onwem na ikom nwayi, inọ ọnọdu-abali. 5Ndi-nwe Gibea we bilie megidem, b͕a ulo buruburu imegidem n'abali; mu ka ha chère ib͕u, ikom nwayi ka ha weda-kwa-ra n'ala, o we nwua. 6M'we jide ikom nwayi, bọ̀ ya abọ̀, zisa ya n'ọhia nile nke ala-nketa Israel: n'ihi na ha emewo ihe-nzube ọjọ na ihe-nzuzu n'Israel. 7Le, unu nile, bú umu Israel, weputanu okwu na ìzù n'onwe-unu n'ebe a. 8Ndi Israel nile we bilie dika otù nwoke, si, Ayi agaghi-eje, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, ayi agaghi-ewezuga kwa onwe-ayi, onye ọ bula ibà n'ulo-ya. 9Ma ub͕u a nka bu ihe ayi gēme Gibea; ayi gārigo imegide ya n'ofufe-nzà; 10ayi gēwere kwa ndikom iri nime ọgu ise nke ebo nile nke Israel, na ọgu ise nime nnù abua na ọgu iri, na nnù abua na ọgu iri nime orú nnù na nnù ise, iwetara ndi Israel ihe-oriri-uzọ, ka ha we me, mb͕e ha biaruru Geba Benjamin, dika ihe-nzuzu nile si di nke ha meworo n'Israel. 11Ndikom nile nke Israel we chikọta onwe-ha imegide obodo ahu, dika otù nwoke ka ejikọtara ha n'otù. 12Ebo Israel nile we zisa ndikom n'ebo Benjamin, si, Gini bu ihe ọjọ a nke emeworo ka ọ di n'etiti unu? 13Ma ub͕u a nyenu ayi ndikom ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, ndi nọ na Gibea, ka ayi we me ka ha nwua, ka ayi kpochapu kwa ihe ọjọ n'Israel. Ma umu Benjamin ekweghi ige nti olu umu-nne-ha, bú umu Israel. 14Umu Benjamin we si n'obodo nile ha chikọta onwe-ha rue Gibea, ipu ibuso umu Israel agha. 15Umu Benjamin we gukọta onwe-ha n'ubọchi ahu site n'obodo nile ha, orú nnù uzọ atọ na nnù ise, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi ndi bi na Gibea, ndi gukọtara onwe-ha, nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa. 16N'etiti ndi nka nile nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa di, ndi nēme aka-ekpe; onye ọ bula nime ha nāmata otù agiri-isi nkume, ghara imahie.
17Ma ndikom Israel gukọtara onwe-ha, orú ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi Benjamin: ndia nile bu ndikom agha. 18Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ. 19Umu Israel we bilie n'ututu, ma ulo-ikwū-ha megide Gibea. 20Ndikom Israel we pua ibuso Benjamin agha; ndikom Israel we do agha n'usoro megide ha na Gibea. 21Umu Benjamin we si na Gibea puta, bibi rue ala n'etiti Israel n'ubọchi ahu orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise. 22Ndi ahu, bú ndikom Israel, we me onwe-ha ka ha di ike, ha we do kwa agha n'usoro ọzọ n'ebe ha doro onwe-ha n'usoro n'ubọchi mbu. 23(Umu Israel we rigo, kwa ákwá n'iru Jehova rue anyasi; ha we jua Jehova ase, si, M'gābiaru kwa nso ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha? Jehova we si, Rigonu megide ya.)
24Umu Israel we biarue nso imegide umu Benjamin n'ubọchi nke-abua. 25Benjamin we si na Gibea puta izute ha n'ubọchi nke-abua ahu, ha we bibie ọzọ rue ala n'etiti umu Israel orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise; ndia nile nāmiputa mma-agha. 26Umu Israel nile, na ndi ahu nile, we rigo, biarue Bet-el, kwa ákwá, nọdu n'ebe ahu n'iru Jehova, bue ọnu n'ubọchi ahu rue anyasi; ha we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova. 27Umu Israel we jua Jehova ase, (n'ihi na n'ebe ahu ka ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke di na mb͕e ahu, 28Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, nēguzo kwa n'iru ya na mb͕e ahu,) si, M'gapu kwa ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha, ma-ọbu #m'gāgha? Jehova we si, Rigonu; n'ihi na echi ka M'gēnye ya n'aka-gi. 29Israel we do ndi nēru nbì megide Gibea buruburu.
30Umu Israel we rigo megide umu Benjamin n'ubọchi nke-atọ, do onwe-ha n'usoro megide Gibea, dika ha mere ub͕ò abua gara aga. 31Umu Benjamin we pua izute ndi Israel, ewe dọpu ha n'obodo; ha we malite itib͕u ufọdu n'etiti ndi Israel na ib͕u ha, dika ha mere ub͕ò abua gara aga, n'uzo abua atuliri atuli, nke otù nime ha nārigo Bet-el, otù nārigo kwa Gibea, n'ọhia, ihe ra ka orú ndikom na iri nime Israel. 32Umu Benjamin we si, Anētib͕u ha n'iru ayi, dika na mbu. Ma umu Israel siri, Ka ayi b͕alaga, si n'obodo dọputa ha n'uzọ atuliri atuli. 33Ndikom nile nke Israel we si n'ọnọdu-ha bilie, do onwe-ha n'usoro na Beal-tema: ndi Israel ndi nēru nbì nāwaputa kwa n'ọnọdu-ha, na Maare-geba. 34Orú nnù ndikom na nnù ise ndi arọputara arọputa n'Israel nile we bia na ncherita-iru Gibea, agha ahu we di arọ́: ma ndi Benjamin amaghi na ihe ọjọ nēmetu ha aru. 35Jehova we tib͕ue Benjamin n'iru Israel: umu Israel we bibie orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri-na-ise nime Benjamin ubọchi ahu: ndia nile nāmiputa mma-agha.
36Umu Benjamin we hu na etib͕uru ha: n'ihi na ndikom Israel nyere Benjamin uzọ, n'ihi na ha tukwasiri obi na ndi nēru nbì ndi ha doro imegide Gibea. 37Ndi nēru nbì we je ọsọsọ, made imegide Gibea; ndi nēru nbì we dọrọ onwe-ha rue obodo, were ọnu mma-agha tib͕ue obodo ahu nile. 38Ma ihe-iriba-ama akara àkà nke diri ndikom Israel na ndi nēru nbì bu nka, na ha gēme ka oké nkwuli anwuru-ọku si n'obodo ahu rigo. 39Ndikom Israel we chigharia n'agha ahu, Benjamin we malite itib͕u ufọdu n'etiti ndikom Israel na ib͕u ha, ihe ra ka orú ndikom na iri: n'ihi na ha siri, N'ezie ndi etib͕uworo nọ̄ n'iru ayi ka ha bu, dika n'agha mbu. 40Nkwuli anwuru ahu we malite isi n'obodo ahu rigo, buru ogidi anwuru-ọku, Benjamin we gha anya n'azu ha, ma, le, obodo ahu dum rigoro n'anwuru-ọku rue elu-igwe. 41Ndikom Israel we chigharia, ndikom Benjamin we ma jijiji: n'ihi na ha huru na ihe ọjọ emetuwo ha aru. 42Ha we chigharia n'iru ndikom Israel rue uzọ ọzara; ma agha ahu sogidesiri ha ike; ndi siri n'obodo nile puta nēbibi ha n'etiti ha. 43Ha we b͕a Benjamin buruburu, chua ha, zọkwasi ha ukwu n'ebe-izu-ike-ha, rue na ncherita-iru Gibea n'akuku ọwuwa-anyanwu. 44Orú nnù ndikom uzò abua na nnù ise nke Benjamin we da; ndia nile bu ndi-dìnkpà. 45Ha we chigharia b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon: ha we ghọrọ ha, bú nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, n'uzọ atuliri atuli, we sogidesi ha ike rue Gidom, tib͕ue nime ha nnù ndikom ise. 46Ndi nile ndi si na Benjamin da n'ubọchi ahu di orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ndi nāmiputa mma-agha; ndia nile bu ndi-dìnkpà. 47Ma nnù ndikom na ọgu iri chighariri b͕alaga n'uzọ ọzara rue nkume di elu, bú Rimon, nọdu na nkume di elu, bú Rimon, ọnwa anọ. 48Ndikom Israel we laghachikuru umu Benjamin, were ọnu mma-agha tib͕ue ha, site n'obodo ndikom rue anu-ulo na ihe ọ bula nke achọtara achọta; ọzọ kwa, obodo nile nke ha chọtara, ha suru ha ọku.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NDI-IKPE 20: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye