Onye-ozi Jehova we si na Gilgal rigorue Bokim. Ọ we si, Emerem unu ka unu si n'Ijipt rigota, M'we me ka unu bata n'ala nke M'ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha; M'we si, M'gaghi-emebi ọb͕ub͕a-ndum rue mb͕e ebighi-ebi, bú nke Mu ńa unu b͕ara; ma unu onwe-unu na ndi bi n'ala nka ab͕ala ndu; unu gākwatu ebe-ichu-aja nile ha: ma unu egeghi nti olum: gini bu nka unu meworo? M'we si kwa, M'gaghi-achupu ha n'iru unu; kama ha gāburu unu ogwu n'akuku-aru-unu, chi nile ha gābu-kwa-ra unu ọnyà. O rue, mb͕e onye-ozi Jehova gwasiri umu Israel nile okwu ndia, na ndi Israel weliri olu-ha, kwa ákwá. Ha we kpọ aha ebe ahu Bokim: ha we chuara Jehova àjà n'ebe ahu.
Gụọ NDI-IKPE 2
Geere nke a ntị NDI-IKPE 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI-IKPE 2:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo