Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-IKPE 17

17
1Ma otù nwoke nke ugwu Efraim di, aha-ya bu Maika. 2Ọ si nne-ya, Nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu i nwere nke ewere ewere, nke gi onwe-gi b͕ara iyi bayere ya, i we kwu kwa ya na ntim, le, ọla-ọcha ahu di n'akam; mu onwem were ya. Nne-ya we si, Onye agọziri agọzi diri Jehova ka nwam bu. 3Ọ we nyeghachi nne-ya nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu, nne-ya we si, Edoworom Jehova ọla-ọcha ahu nsọ n'ezie site n'akam inye nwam, ime arusi apiri api na arusi awuru awu: ma ub͕u a m'gēnyeghachi gi ya. 4Ọ we nyeghachi nne-ya ọla-ọcha ahu, nne-ya we chiri ọgu ego ọla-ọcha iri, nye onye-nnucha-ọla, o we me ya arusi apiri api na arusi awuru awu: o we di n'ulo Maika. 5Nwoke ahu, bú Maika, we nwe ulo Chineke, o we me ephod na teraphim, mejue aka nke otù nime umu-ya ndikom, o we ghọrọ ya onye-nchu-àjà. 6Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel: onye ọ bula nēme ihe ziri ezi n'anya-ya.
7Otù nwa-okorọbia di kwa nke sitere na Bet-lehem-juda, site n'ab͕uru Juda, onye ahu bu onye Livai, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa n'ebe ahu. 8Nwoke ahu we si n'obodo ahu, bú Bet-lehem-juda, je ije inọ dika ọbìa ebe ọ gāchọta ọnọdu: o we ba n'ugwu Efraim rue ulo Maika ime ihe o ji bili ije-ya. 9Maika we si ya, Òle ebe i si bia? O we si ya, Onye Livai ka m'bu site na Bet-lehem-juda, mu onwem nēje kwa inọ dika ọbia ebe m'gāchọta ọnọdu. 10Maika we si ya, Biri n'ulom, ghọ-kwa-ram nna na onye-nchu-àjà, mu onwem gēnye kwa gi ego ọla-ọcha iri kwa-arọ, na nke-ekike uwe, na ihe i gēji di ndu. Onye Livai we ba nime. 11Onye Livai we kwere ibiri n'ulo nwoke; nwa-okorọbia ahu we di ya ka otù nime umu-ya ndikom. 12Maika we mejue aka onye Livai ahu, nwa-okorọbia ahu we ghọrọ ya onye-nchu-àjà, nọ n'ulo Maika. 13Maika we si, Ub͕u a ka m'mara na Jehova gēmem nma, n'ihi na onye Livai burum onye-nchu-àjà.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

NDI-IKPE 17: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara