Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova ọzọ; Jehova we nye ha n'aka ndi Filistia ọgu arọ abua.
Ma otù nwoke nke Zọra di, sitere n'ab͕uru ndi Dan, aha-ya bu Manoa; ma nwunye-ya bu nwanyi-àgà, ọ mughi kwa nwa. Mọ ozi nke Jehova we me ka nwayi ahu hu ya anya, si ya, Biko, le, gi onwe-gi bu nwayi-àgà, i mughi kwa nwa: ma i gāturu ime, mua nwa-nwoke. Ma ub͕u a, biko, lezie anya, aṅu-kwa-la manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú: n'ihi na, le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke: aguba agaghi-aga n'elu isi-ya: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ: ya onwe-ya gāmalite kwa izọputa Israel n'aka ndi Filistia. Nwayi ahu we bia, gwa di-ya, si, Onye nke Chineke biakuterem, n'ile ya anya ọ di kwa ka mọ-ozi nke Chineke n'ile ya anya, ọ di itu egwu nke-uku; ma ajughm ya ebe o si bia, o gosighkwam aha-ya: o we sim, Le, i gaje itu ime, mua nwa-nwoke; ma ub͕u a aṅula manya-vine ma-ọbu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú: n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka nwata ahu gābu site n'afọ rue ubọchi ọnwu-ya. Manoa we riọ Jehova aririọ, si, Biko, Onye-nwe-ayi, ka onye nke Chineke ahu nke I zitere biaghachikute ayi ọzọ, ariọm I, ka o zí kwa ayi ihe ayi gēme nwata ahu nke agāmu. Chineke we ge nti olu Manoa; mọ-ozi nke Chineke we biakute nwayi ahu ọzọ ka ya onwe-ya nānọdu n'ubi: ma Manoa, bú di-ya, anọyeghi ya. Nwayi ahu we me ngwa, b͕a ọsọ, gosi di-ya, si ya, Le, nwoke ahu nke biakuterem ubọchi a emewo ka m'hu ya anya ọzọ. Manoa we bilie, jeso nwunye-ya, biakute nwoke ahu, si ya, Gi onwe-gi, ì bu nwoke ahu nke gwara nwayi a okwu? O we si, Mu ka ọ bu. Manoa we si, Ub͕u a ka okwu-gi nile rè: gini gābu ikpé bayere nwata ahu, gini gābu kwa omume-ya? Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, N'ihe nile nke m'siri nwayi a ya lezie anya. Ọ gaghi-eri ihe sitere n'ihe ọ bula nke nēsi n'osisi vine nke manya-vine puta, ya aṅu-kwa-la manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ya eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú; ihe nile nke m'nyere ya n'iwu ka ọ gēdebe.