Ma otù onye gāsi, Gi onwe-gi nwere okwukwe, mu onwem nwe-kwa-ra ọlu: gosim okwukwe-gi ma ọlu-gi adighi ya, mu onwem gēsite kwa n'ọlum gosi gi okwukwem. Gi onwe-gi kwere na Chineke bu otù; i nēme nke-ọma: ndi-mọ ọjọ kwe-kwa-ra, we kuja. Ma ì nāchọ ka i mara, gi madu efu, na okwukwe bu ihe nādighi-aluputa ihe ma ọlu adighi ya? Èsiteghi n'ọlu gu Abraham nna-ayi n'onye ezi omume, mb͕e ọ churu Aisak nwa-ya nwoke n'elu ebe-ichu-àjà? I huwo na okwukwe-ya soro ọlu-ya lukọ ọlu, esite-kwa-ra n'ọlu ahu me ka okwukwe ahu zue okè; ewe mezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke nāsi, Abraham we kwere okwu Chineke, ewe gua ya nye ya n'ezi omume; ewe kpọ ya eyì nke Chineke. Unu ahuwo na anēsite n'ọlu gu madu n'onye ezi omume, adighi-esite kwa nání n'okwukwe. Ma n'uzọ di otù a èsiteghi kwa n'ọlu gu Rehab, bú nwanyi nākwa iko, n'onye ezi omume, mb͕e ọ kpọbatara ndi-ozi ahu, we zipu ha n'uzọ di iche? N'ihi na dika aru bu ihe nwuru anwu ma mọ adighi ya, ọbuná otú a okwukwe bu ihe nwuru anwu ma ọlu adighi ya.
Gụọ JEMES 2
Geere nke a ntị JEMES 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JEMES 2:18-26
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo