Bilie, nwue; n'ihi na ìhè-gi abiawo, ebube Jehova awawo kwa n'aru gi dika anyanwu. N'ihi na, le, ọchichiri nēkpuchi kwa ndi nile di iche iche: ma n'aru gi ka Jehova gāwa dika anyanwu, ebube-Ya ka agāhu kwa n'aru gi. Mba nile gējeru kwa ìhè-gi, ndi-eze ejerue onwu-maramara nke ọwuwa-gi. Welie anya-gi abua le buruburu, hu: ha nile achikọtawo onwe-ha, ha abiakutewo gi: umu-gi ndikom gēsi n'ebe di anya bia, agēku kwa umu-gi ndinyom n'akuku-gi. Mb͕e ahu i gāhu we nwue enwu, obi-gi gātu kwa oké egwu, sa mbara; n'ihi na agēchigharikute gi ihe bara uba nke oké osimiri, àkù nke mba di iche iche gābiakute gi. Ìgwè camel gēkpuchi gi, umu-camel nke Midian na Ifa: ha nile gēsi na Sheba bia: ọla-edo na frankincense ka ha gēbute, ọ bu kwa ozi ọma otuto Jehova ka ha gēzisa.
Gụọ AISAIA 60
Geere nke a ntị AISAIA 60
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: AISAIA 60:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị