Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 53:3-12

AISAIA 53:3-12 IGBOB

Eledara ya anya, ọ bu kwa onye madu rara aka; onye nwere ọtutu ihe-nb͕u na onye mara ọria nke-ọma: e, dika onye madu nēzonari iru-ha, otú a ka eledara ya anya, ayi we ghara igu ya n'ihe. N'ezie ọria nile nke ayi ka ya onwe-ya bupuworo, ihe-nb͕u nile nke ayi kwa, o buruwo ha; ma ayi onwe-ayi guru ya n'onye etiworo ihe-otiti, onye Chineke tiworo ihe, na onye ewedara n'ala. Ma ya onwe-ya bu onye amapúworo site na njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo site n'ajọ omume nile nke ayi: ahuhu-nmehie nke udo-ayi di n'aru ya; ọ bu kwa ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike. Ayi nile kpafuru akpafu dika ìgwè aturu: ayi chere iru, onye ọ bula n'uzọ nke aka ya: ma Jehova emewo ka ajọ omume nke ayi nile dakwasi ya. Achiri ya n'ihe-ike, ma ya onwe-ya wedara onwe-ya n'ala, we ghara isaghe ọnu-ya; dika aturu nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya, na dika nne-aturu nke dara ob͕i n'iru ndi nākpacha ya aji; e, ọ dighi-asaghe ọnu-ya. Site na nmeb͕u, site kwa n'ikpé, ka ewepuru ya: ma ndi ọb͕ọ-ya, ònye n'etiti ha nātughari n'obi na ebipuru ya n'ala ndi di ndu? site na njehie nke ndim ka ihe-otiti diri ya. Ewe me ka ílì-ya di n'etiti ndi nēmebi iwu, ya na ọgaranya nọ kwa n'ọnwu-ya; ọ bu ezie na ọ dighi ihe-ike o mereri, ọ dighi kwa aghughọ di n'ọnu-ya. Ma ọ tọrọ Jehova utọ izọpia ya; O mewo ka ọ ria ọria: ọ buru na nkpuru-obi-ya achu àjà-ikpe-ọmuma, ọ gahu nkpuru-ya, me ka ubọchi-ya nile di ogologo, ihe nke nātọ Jehova utọ gāga kwa nke-ọma n'aka-ya. Ihe nke sitere na ndọb͕u nkpuru-obi-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ka ọ gāhu, afọ gēju ya: ihe-ọmuma-ya ka onye ezi omume ahu, bú orùm, gēji me ka ọrà madu ghọ ndi ezi omume: ajọ omume nile ha ka ya onwe-ya gēbu kwa. N'ihi nka ka M'gēkère ya òkè n'etiti ndi bara uba, o gēso kwa ndi nwere ume kèsa ihe ọ kwatara n'agha; n'ihi na ọ b͕apuru nkpuru-obi-ya dika miri nye ọnwu, ọ bu kwa na ndi-njehie ka aguru ya: ma ya onwe-ya bupuru nmehie ọtutu madu, ọ bu kwa ndi-njehie ka ọ nāriọrọ aririọ.