Ònye kwere ihe ayi nuworo? ogwe-aka Jehova kwa, n'àru onye ka ekpugheworo ya? N'ihi na o tolitere n'iru Ya dika ome, na dika nkpọrọgwu nke putara n'ala kpọrọ nku: ọ dighi udi-aru oma ọ nwere, ọ dighi kwa ima-nma; ayi we hu ya, ma ọ maghi nma n'ile ya anya nke ayi gēji chọsie ya ike. Eledara ya anya, ọ bu kwa onye madu rara aka; onye nwere ọtutu ihe-nb͕u na onye mara ọria nke-ọma: e, dika onye madu nēzonari iru-ha, otú a ka eledara ya anya, ayi we ghara igu ya n'ihe. N'ezie ọria nile nke ayi ka ya onwe-ya bupuworo, ihe-nb͕u nile nke ayi kwa, o buruwo ha; ma ayi onwe-ayi guru ya n'onye etiworo ihe-otiti, onye Chineke tiworo ihe, na onye ewedara n'ala. Ma ya onwe-ya bu onye amapúworo site na njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo site n'ajọ omume nile nke ayi: ahuhu-nmehie nke udo-ayi di n'aru ya; ọ bu kwa ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike. Ayi nile kpafuru akpafu dika ìgwè aturu: ayi chere iru, onye ọ bula n'uzọ nke aka ya: ma Jehova emewo ka ajọ omume nke ayi nile dakwasi ya. Achiri ya n'ihe-ike, ma ya onwe-ya wedara onwe-ya n'ala, we ghara isaghe ọnu-ya; dika aturu nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya, na dika nne-aturu nke dara ob͕i n'iru ndi nākpacha ya aji; e, ọ dighi-asaghe ọnu-ya.
Gụọ AISAIA 53
Geere nke a ntị AISAIA 53
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: AISAIA 53:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị