Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 48:1-11

AISAIA 48:1-11 IGBOB

Nurunu nka, unu ulo Jekob, ndi anākpọ n'aha Israel, ndi siwo-kwa-ra na miri Juda puta; ndi ji aha Jehova aṅu iyi, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha nēhota, ma ọ bughi n'ezi-okwu, ọ bughi kwa n'ezi omume. N'ihi na ha akpọwo onwe-ha ndi sitere n'obodo nsọ, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha dabereworo; Jehova usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya. Ihe mbu nile site na mb͕e ochie ka M'gosiworo; ọ bu kwa n'ọnum ka ha siri puta, M'we meka anu ha: na mberede ka M'mere ha, ha we me. N'ihi na M'mara na onye siri ike ka i bu, na ọ bu akwara ígwè ka olu-gi bu, na egedege-iru-gi bu kwa ọla; M'we gosi gi ya site na mb͕e ochie; tutu o me emerem ka i nuru: ka i we ghara isi, Arusim emewo ha, ọ bu kwa arusim apiri api na arusim awuru awu nyere ha iwu. I nuwo ya; gi le ihe a nile; unu onwe-unu kwa, ùnu agaghi-egosi ya? Emewom ka i nuru ihe ọhu di iche site n'ub͕u a, bú ihe echebeworo na nzuzo, nke i nāmaghi. Ub͕u a ka ekèworo ha, ọ bughi site na mb͕e ochie; ọzọ, tutu ubọchi ta erue i nughi kwa ha;ka i we ghara isi, Le, amaram ha. Otú ọ di, i nughi; i maghi kwa; site kwa na mb͕e ochie nti-gi egheghi oghe: n'ihi na amaram na i nāghọb͕u nke-uku, ọzọ, Onye nējehie ejehie site n'afọ nne-ya, ka anākpọ gi. N'ihi aham ka M'nēme ka iwem nọ ọdù, ọ bu kwa n'ihi otutom ka M'nēb͕ochi ya n'ebe i nọ, ka M'we ghara ibipu gi. Le, anuchawom i, ma ọ bughi dika ọla-ọcha; arọputawom i n'oké ọku nke iweda-n'ala. N'ihi Mu onwem, n'ihi Mu onwem, ka M'gēme ya; n'ihi na le ka esi me ka aham ghara idi nsọ nke-uku! M'gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum.