Kasienu, kasienu ndim obi, ka Chineke-unu nāsi. Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n'obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n'aka Jehova okpukpu abua n'ihi nmehie-ya nile.
Ọ bu olu nke onye nākpọ nkpu n'ọzara, si, Dozienu uzọ Jehova, menu ka uzọ atuliri atuli guzoziere Chineke-ayi n'ala ihe nādighi. Agēme ndagwurugwu ọ bula ka ọ di elu, agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala: ebe di nkputankpu gāghọ kwa, ebe guzoziri eguzozi, nkume nile di elu gāghọ kwa ebe di lari: agēkpughe kwa ebube Jehova, anu-aru nile, bú madu, gāhukọ kwa ya n'otù: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo. Ọ bu olu onye nāsi, Kpọ nkpu. Otù onye we si, Gini ka m'ganākpọ nkpu? Anu-aru nile bu ahihia, ima-nma-ya nile di kwa ka okoko ọhia: ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo; n'ihi na iku-ume Jehova ekukwasiwo ya: n'ezie ahihia ka ndi ahu bu. Ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo: ma okwu Chineke-ayi gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.
Rigo n'elu ugwu di elu, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Zaion; welie olu-gi n'ike, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Jerusalem; welie ya, atula egwu; si obodo nile nke Juda, Le, Chineke-unu! Le, Ọnye-nwe-ayi Jehova gābia dika onye di ike, ogwe-aka-Ya ganāchi-kwa-ra Ya: le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n'aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n'iru Ya. Dika onye-ọzùzù-aturu ka Ọ gāzù ìgwè aturu-Ya, n'ogwe-aka-Ya ka Ọ gāchikọta umu-aturu, ọ bu kwa n'obi-Ya ka O gēkuru ha, Ọ gēwere nwayọ nēdu ndi nēnye umu ara.
Ònye tùworo miri nile n'ọbu-aka-Ya, were ntù-aka tùputa elu-igwe, nagidezue ájá nke uwa na mb͕é, sì ugwu nile n'ihe-osìsì, tùa ugwu ntà nile n'ihe-ọtùtù? Ònye tùputaworo ma-obu nke Jehova, ma-ọbu, dika onye-ndum-ọdu-Ya, nēme ka Ọ mara ihe? Yà na onye b͕ara ìzù? ònye mere ka Ọ ghọta ihe? ònye zíri Ya ihe n'okporo-uzọ ikpé, zí kwa Ya ihe-ọmuma, me kwa ka Ọ mara uzọ nghọta? Le, aguwo mba nile n'otù ntu-miri nātupu n'ite-miri, na n'uzuzu nke ihe-ọtùtù: le, Ọ nāchili agwe-etiti dika ifurifu-ihe. Lebanon ezughi kwa isure ọku, anu-ọhia-ya ezughi kwa isure àjà-nsure-ọku. Mba nile di ka ihe-efu n'iru Ya; dika ihe nērughi ihe-efu na ebe tọb͕ọrọ n'efu ka aguworo ha nye Ya.