Odide-akwukwọ nke Hezekaia eze Juda, mb͕e ọ riara ọria, o we puta N'ọrìa-ya nwe aru-ike. Mu onwem siri, Ọ bu n'idi-jū nke ubọchim nile ka m'ghaghi ila n'ọnu-uzọ-ama nke ala-mọ. Anapuwom arọm fọduru afọdu. Asirim, M'gaghi-ahu Ja, ọbuná Ja n'ala ndi di ndu: M'gaghi-elegide kwa madu anya ọzọ n'etiti ndi bi n'ala ọgwugwu-ndu. Emewo ka ebe-obibim bulie ije, esiwo kwa n'ebe m'nọ bulaga ya dika ulo-ikwū onye-ọzùzù-aturu: Apiakọtawom ndum dika ọkpa-ákwà si apiakọta ákwà; na ǹkwé-ákwà ka Ọ gēbipum: Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia. Edozirim nkpuru-obim rue ututu; dika ọdum, otú a ka Ọ nānyaji ọkpukpum nile: Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia. Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m'nēbe ebe; Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n'ile anya n'elu; Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe. Gini ka m'gēkwu? Ọ gwaram okwu, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya: M'ganēje nwayọ arọm nile n'ihi idi-ilu nke nkpuru-obim. Onye-nwe-ayi, ihe ndia ka madu ji adi ndu, Ọ bu kwa nime ha ka ndu mọm dichasi: I gēme kwa ka aru dim ike; Gi me kwa ka m'di ndu. Le, ihe m'ji nwe ihe di ilu ilu bu ka m'we nata udo: Ma Gi onwe-gi huru nkpuru-obim n'anya si-ike, we si n'olùlù nke itọb͕orọ-n'efu dọputam: N'ihi na I tufuru nmehiem nile n'azu Gi. N'ihi na ala-mọ adighi-ekele Gi, ọnwu adighi-eto Gi: Ndi nārida n'olùlù adighi-ele anya ezi-okwu-Gi. Onye di ndu, onye di ndu, onye ahu gēkele Gi, dika m'si eme ta: Nna gēme ka umu mara ezi-okwu-Gi. Jehova ejikerewo izọputam: Ubọ-akwaram nile ka ayi ganākpọ Ubọchi nile nke ndu-ayi n'ulo Jehova.
Gụọ AISAIA 38
Geere nke a ntị AISAIA 38
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: AISAIA 38:9-20
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị