Ahuhu gādiri gi onye nāpunara madu ihe, ma gi onwe-gi bu onye anāpunaraghi ihe; onye nāghọb͕u kwa aghọb͕u, ma ha aghọb͕ughi gi! mb͕e i napubìri madu ihe, agāpunara gi ihe; mb͕e i ghọb͕ubìri, ha gāghọb͕u gi. Jehova, mere ayi amara; Gi ka ayi leworo anya: buru ogwe-aka-ha kwa-ututu, buru kwa nzọputa-ayi na mb͕e ahuhu. Site n'olu ùzù ka ndi di iche iche b͕alagaworo; site na nbuli-Gi ka mba nile b͕asaworo. Agāchikọta kwa ihe-unu akwatara n'agha dika nchikọta nke ọbubu: dika nb͕aghari nke igurube, otú a ka ọ nāb͕aghari n'elu ya. Jehova di elu; n'ihi na O bi n'elu: O mejuwo Zaion n'ikpe ziri ezi na ezi omume. Ikwesi-ntukwasi-obi gādi kwa na mb͕e-gi nile, iba-uba nke nzọputa na amam-ihe na ihe-ọmuma: egwu Jehova, nke ahu bu àkù-ya. Le, dìnkpà-ha nile nēti nkpu n'èzì: ndi-ozi udo nākwakpọ anya. Uzọ nile atuliri atuli tọb͕ọrọ n'efu, onye nāgabiga n'uzọ akwusiwo: o mebiwo ọb͕ub͕a-ndu, ju obodo nile, ọ gughi madu n'ihe. Ala nēru újú, talata: Lebanon nwere iru-ihere, ọ janwuwo ajanwu: Sheron di ka ala ihe nādighi; Beshan na Kamel nārurupu kwa akwukwọ-ha.
Gụọ AISAIA 33
Geere nke a ntị AISAIA 33
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: AISAIA 33:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo