Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-HIBRU 9:1-10

NDI-HIBRU 9:1-10 IGBOB

Ya mere, ọbuná ọb͕ub͕a-ndu mbu nwere ihe di iche iche aguru n'ihe ziri ezi n'ikpere Chineke, nwe kwa ebe nsọ ya, bú ebe nsọ nke uwa nka. N'ihi na edoziri ulo-ikwū, ulo mbu, nke ihe-idọba-oriọna ahu, na table ahu, na ob͕e achicha ahu anēche n'iru Chineke di nime ya; nke anākpọ Ebe Nsọ. Ma mb͕e agabigasiri ákwà-nb͕ochi nke-abua, ulo-ikwū nke anākpọ Ebe Nsọ kachasi ebe nsọ nile di; nke nwere ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke amachitara ọla-edo gburugburu n'akuku nile, nke ite ọla-edo nke nwere manna di nime ya, ya na nkpa-n'aka ahu nke Eron nke mara ifuru, na mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu; ma n'elu ya cherubim nke ebube di nēnye ebe anēme ka obi Chineke juru ǹdò; nke ayi nēnweghi ike ikwu okwu bayere ha n'otù n'otù ub͕u a. Ma ebe edoziworo ihe ndia otú a, ndi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū mbu mb͕e nile, nēkpezu ekpere nile ha; ma nání onye-isi-nchu-àjà nābà n'ulo-ikwū nke-abua, nání otù mb͕e n'arọ, nāb͕aghi aka ọbara, nke ọ nēche n'iru Chineke n'ihi onwe-ya, na n'ihi amaghi-ama nile nke ndi Israel: n'ihi na Mọ Nsọ nēgosi nka, na akēmeghi ka uzọ ibà n'ebe nsọ ahu puta ìhè, mb͕e ulo-ikwū mbu ahu nēguzogide ub͕u a: bú ulo-ikwū nke bu ulọ aturu oge nke di ub͕u a; anēche kwa ma onyinye ma àjà n'iru Chineke dika ulo-ikwū ahu si di, bú ihe nāpughi ime onye nēkpe ekpere ka o zu okè n'akuku akọ-na-uche, ebe ha bu nání (ha na ihe-oriri na ihe-ọṅuṅu na ime-baptism di iche iche) ihe di iche iche nke anu-aru aguru n'ihe ziri ezi, enyere n'iwu rue oge imezi ihe.