Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus; na ọbu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ebe Onye ahu nọ, bú Onye mere Ya ka Ọ buru Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà, dika Moses di kwa n'èzi-na-ulo-Ya dum. N'ihi na aguwo Onye a n'Onye kwesiri otuto kari Moses, n'uzọ na otú ahu onye luru èzi-na-ulo nwere nsọpuru kari èzi-na-ulo-ya. N'ihi na èzi-na-ulo ọ bula nwere onye luru ya; ma Onye luru ihe nile bu Chineke. Ọ bu kwa ezie na Moses kwesiri ntukwasi-obi n'èzi-na-ulo-Ya dum dika onye nēje ozi, ka ọ buru ihe-àmà nke ihe nile agaje ikwu; ma Kraist kwesiri ntukwasi-obi dika Ọkpara, Nke bu onye-isi n'èzi-na-ulo-Ya; Onye ayi onwe-ayi bu èzi-na-ulo-Ya, ma ọ buru na ayi jidesie nkwuwa-okwu-ayi na inya-isi nke olile-anya-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile.
Gụọ NDI-HIBRU 3
Geere nke a ntị NDI-HIBRU 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI-HIBRU 3:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị