N'ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n'ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n'aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n'ebube, ka O site n'ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè. N'ihi na ma Onye nēdo ha nsọ ma ndi anēdo nsọ, ha nile sitere n'otù Nna: ọ bu kwa n'ihi ihe a ka ihere ikpọ ha umu-nna-Ya adighi-eme Ya, Ọ si, Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi, N'etiti nzukọ-Gi k m'gābù abu nye Gi. Ọzọ kwa, Mu onwem ganātukwasi obim na Ya. Ọzọ kwa, Le, Mu onwem na umu-ntakiri Chineke nyerem. Ya mere ebe umu-ntakiri ahu bu ndi nēnwekọ anu-aru na ọbara, Ya onwe-ya n'otù uzọ ahu keta-kwa-ra ihe ndia; ka O we site n'ọnwu me ka onye ahu ghara idi irè, bú onye nwere ike nke ọnwu, ya bu ekwensu; ka O we site kwa n'ọnwu naputa ndi ahu, ka ha ra, bú ndi ewere egwu ọnwu tinye n'ibu-orù n'ogologo ndù-ha nile. N'ihi na ọ bu ihe amara nke-ọma na ọ bughi ndi-mọ-ozi ka Ọ nējide aka, kama Ọ nējide nkpuru Abraham aka. O sitere na ya ji ugwọ ka eme ka O yie umu-nna-Ya n'ihe nile, ka O we ghọ onye-isi-nchu-àjà di ebere, Onye kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi, n'ihe nile diri Chineke, ka O we me ka obi Chineke juru n'ebe nmehie nile nke ndi nke Ya di. N'ihi na ebe Ya onwe-ya huworo ahuhu site n'ọnwunwa anwara Ya, Ọ puru iyere ndi anānwa aka.
Gụọ NDI-HIBRU 2
Geere nke a ntị NDI-HIBRU 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI-HIBRU 2:10-18
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị