NDI-HIBRU 11:32-34
NDI-HIBRU 11:32-34 IGBOB
Gini ka m'gēkwu kwa ọzọ? n'ihi na oge gāgwunarim ma ọ buru na akọm akukọ bayere Gideon, Berak, Samson, Jefta; ha na Devid na Samuel na ndi-amuma: ndi sitere n'okwukwe lub͕u ala-eze, lu ọlu ezi omume, nata nkwa di iche iche, kpuchita ọnu ọdum, menyu ike ọku, b͕anari iru mma-agha, ndi esitere n'okwukwe me ka ha di ike site n'adighi-ike, me ka ha di ike n'agha, ndi sitere n'okwukwe chulaga usu-ndi-agha nke ndi ala ọzọ.

