I putawo ìhè izọputa ndi-Gi, Izọputa onye-Gi etere manu; I mabipuwo isi n'ulo ndi nēmebi iwu, B͕aba ntọ-ala-ya ọtọ rue olu. Selah I jiwo nkpa-n'aka-ya dupue ndi-agha-ya isi: Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam: Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n'ala n'ebe-nzuzo. I chiriwo inyinya-Gi zọ ije n'oké osimiri, Bú obo nke ọtutu miri. Anurum, afọm we ma jijiji, N'olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta; Ire-ure nābà n'ọkpukpum nile, ọ bu kwa n'ọnọdum ka m'nāma jijiji: Ka m'we zue ike rue ubọchi ahuhu, Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n'usu ndi nāpunara madu ihe. Asi na osisi fig adighi-ama ifuru, Na ọ dighi ihe-ọmume di n'osisi vine; Na ihe aluputara n'osisi olive ebilatawo, Na ubi nile emeghi ihe-oriri; Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n'ogige ewu na aturu, Na ọ dighi ìgwè ehi di n'ulo ehi: Ma mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova, M'gēteghari egwú ọṅù nime Chineke nke nzọputam. Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem, Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele, Ọ bu kwa n'ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M'zọ ije. Ọ diri Onye-isi Abù, n'ubọ-akwaram nile.
Gụọ HABAKUK 3
Geere nke a ntị HABAKUK 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: HABAKUK 3:13-19
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị