Chineke we si, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke Mu onwem nāb͕a n'etiti Mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke diyere unu, rue ọb͕ọ nile ebighi-ebi: eke na ogwurugwu m ka tinyeworo n'igwe-oji, ọ gāghọ kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na uwa. Ọ gēru kwa, mb͕e M'nēme ka igwe-oji puta n'elu uwa, na agāhu eke-na-ogwurugwu ahu n'igwe-oji ahu, M'we cheta ọb͕ub͕a-ndum, nke di n'etiti mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile; miri agaghi-aghọ kwa iju-miri ọzọ ibibi anu-aru nile. Eke-na-ogwurugwu ahu gādi kwa n'igwe-oji; M'gāhu kwa ya anya, icheta ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi di n'etiti Chineke na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile nke di n'elu uwa. Chineke we si Noa, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọbub͕a-ndu ahu nke M'meworo ka o guzosie ike n'etiti Mu na anu-aru nile nke di n'elu uwa.
Gụọ JENESIS 9
Geere nke a ntị JENESIS 9
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 9:12-17
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị