Ma Chineke chetara Noa, na anu nile di ndu, na anu-ulo nile nke ya na ha nọ n'ub͕ọ; Chineke we me ka ifufe gabiga n'elu uwa, miri we taba; e mechikwara isi-iyi nile nke ob͕u-miri na window nile nke elu-igwe, eb͕ochi-kwa-ra oké miri-ozuzo nēsite n'elu-igwe; miri we si n'elu uwa nālaghachi mb͕e nile: miri ahu we bilata mb͕e ọgu ubọchi asa na iri gwusiri. Ub͕ọ ahu we tọb͕ọrọ n'elu ugwu nke Ararat n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa ahu. Miri we nēbilata mb͕e nile rue ọnwa nke-iri: n'ọnwa nke-iri ahu, n'ubọchi mbu nke ọnwa, ka ahuru elu ugwu.
Gụọ JENESIS 8
Geere nke a ntị JENESIS 8
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 8:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo