Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 41:38-50

JENESIS 41:38-50 IGBOB

Fero we si ndi-orù-ya, Àyi gāchọta madu dika onye a, bú nwoke nke mọ Chineke di nime ya? Fero we si Josef, Ebe Chineke meworo gi ka i mara ihe a nile, ọ dighi onye nwere nghọta, nke ma-kwa-ra ihe, dika gi: gi onwe-gi gābu onye-isi ulom, ọ bu kwa n'okwu ọnu-gi ka ndim nile gēdo onwe-ha n'usoro: nání n'oche-eze ka m'gādi uku kari gi, Fero we si Josef, Le, edowom i onye-isi ala Ijipt nile. Fero we b͕upu nb͕a-aka-akàrà n'aka-ya, b͕aye ya n'aka Josef, yibe ya uwe nke ezi ákwà ọcha, tukwasi iyab͕a ọla-edo n'olu-ya, me ka o were ub͕ọ-ala nke-abua o nwere nāga-ghari; ha we kpọ nkpu n'iru ya, si, B͕u ikpere n'ala: o we do ya onye-isi ala Ijipt nile. Fero we si Josef, Mu onwem bu Fero, asi kwa na i nọghi ya ọ dighi onye ọ bula gēweli aka-ya ma-ọbu ukwu-ya n'ala Ijipt nile. Fero we kpọ aha Josef Zafenat-pania; o nye ya Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, na nwunye. Josef we pua jeghari n'ala Ijipt. Josef b͕ara orú arọ na iri mb͕e o guzoro n'iru Fero eze Ijipt. Josef we si n'iru Fero pua, gabiga n'ala Ijipt nile. N'arọ asa ahu nke anēriju afọ ala we nēme nri ri nne. O we chikọta ihe-oriri nile nke arọ asa ahu nke di n'ala Ijipt, tiye ihe-oriri ahu n'obodo nile: ihe-oriri nke ubi nke obodo ọ bula nke di ya gburugburu ka o tiyere n'etiti ya. Josef we kwakọba ọka dika ájá nke oké osimiri, nēme ka ọ ba uba nke-uku, rue mb͕e ọ rapuru igu ya ọnu; n'ihi na ọ dighi nguta. Amuru umu-ndikom abua nye Josef tutu arọ oké unwu abia, ndi Asenat nwa-nwayi Poti-fera, bú onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara