Madu ahu we mara aru Iv, bú nwunye-ya; o we turu ime, mua Ken, si, Enwetawom nwoke site n'iye-aka Jehova. Ọzọ kwa, ọ mua nwa-nṅe-ya nwoke, bú Ebel. Ebel we buru onye nāzù ìgwè ewu na aturu, ma Ken bu onye nālu ọlu ubi. O rue, n'ọgwugwu ubọchi ufọdu, na Ken wetara ufọdu nime nkpuru ala ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova. Ebel kwa, ya onwe-ya wetakwara ufọdu nime umu eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu ya, na ufọdu nime iberibe-ha mara abuba. Jehova we le Ebel, le kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, anya ọma: ma Ken na onyinye-inata-iru-ọma-ya, O leghi ha anya ọma. Ken we we iwe di ọku nke-uku, iru-ya we b͕arua. Jehova we si Ken, N'ìhi gini ka i nēwe iwe di ọku? ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka iru-gi b͕aruru?
Gụọ JENESIS 4
Geere nke a ntị JENESIS 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 4:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị