Ma Leban nwere umu-ndinyom abua: aha nke-okenye bu Lia, aha nke-ntà bu Rechel. Anya Lia esighi ike; ma Rechel mara nma n'aru ma kwa nma ile anya. Jekob we hu Rechel n'anya; ọ si, M'gēfè gi arọ asa n'ihi Rechel, bú nwa-gi nwayi nke-ntà. Leban we si, Ọ di nma ka m'nye gi ya, kari were ya nye nwoke ọzọ: nọyerem. Jekob we fè òfùfè n'ihi Rechel arọ asa; ha di n'anya-ya dika ubọchi ole-na-ole, n'ihi ihu-n'anya o ji hu ya. Jekob we si Leban, Nyem nwunyem, n'ihi na ubọchim nile ezuwo, ka m'we bakuru ya. Leban we chikọta ndi ebe ahu nile, me oké oriri. O rue, n'anyasi, na o kuru Lia nwa-ya, me ka ọ bakuru Jekob; Jekob we bakuru ya. Leban we nye ya Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, ka ọ buru nwayi nējere Lia nwa-ya nwayi ozi. O rue na, n'ututu Jekob wee hu na nwanyi ahu bu Lia: ọ we si Leban, Gini bu nka i meworom? Ọ̀ bughi n'ihi Rechel ka m'efère òfùfè n'aka gi? n'ihi gini kwa ka i ghọb͕urum?
Gụọ JENESIS 29
Geere nke a ntị JENESIS 29
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 29:16-25
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo