Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 27:1-45

JENESIS 27:1-45 IGBOB

I O rue, mb͕e Aisak ghọrọ agadi, mb͕e anya-ya abua nāhu kwa inyogho-inyogho, nke mere ka ọ ghara ihu uzọ, na ọ kpọrọ Isọ, bú nwa-ya nke-okenye, si ya, Nwam: ọ si ya, Lekwam. Ọ si, Biko, le, aghọwom agadi, amaghi ubọchi ọnwum. Ma ub͕u a, biko, chiri ihe-gi, bú àkpà-àkú-gi na uta-gi, pua je ọhia, chutaram anu-nchuta; sierem nri utọ, dika nke m'huru n'anya, butekwara m, ka m'we rie; ka nkpuru-obim we gọzie gi tutu mu anwua. Ma Rebeka nānu ya mb͕e Aisak gwara Isọ, bú nwa-ya, okwu. Isọ we je ọhia ichuta anu-nchuta, na iweta ya. Rebeka we gwa Jekob, bú nwa-ya, okwu, si Le, anurum nna-gi ka ọ nāgwa Isọ nwanne-gi okwu, si, Wetaram anu-nchuta, sierem nri utọ, ka n'we rie, gọzi kwa gi n'iru Jehova tutu ọnwum. Ma ub͕u a, nwam, ge nti n'olum, dika ihe nke mu onwem nēnye gi n'iwu si di. Biko, je ebe ìgwè ewu na aturu di, si n'ebe ahu chitaram umu-ewu abua di nma; m'gēwere kwa ha siere nna-gi nri utọ, dika nke ọ huru n'anya: i gēbuga-kwa-ra nna-gi, ka ọ we rie, ka ọ we gọzie gi tutu ọnwu-ya. Jekob we si Rebeka nne-ya, Le, Isọ nwannem bu nwoke b͕ara aji, ma mu onwem bu nwoke nāb͕aghi aji. Eleghi anya nnam gēbitum aka, m'agādi kwa ka onye nākwa emò n'anya-ya; m'gēme kwa ka nkọcha biakwasim, ọ bughi kwa ngọzi. Nne-ya we si ya, Ya dikwasim, bú nkọcha-gi, nwam: nání ge nti n'olum, je chitaram ha. Ọ je, chita, butere nne-ya: nne-ya we sie nri utọ, dika nke nna-ya huru n'anya. Rebeka we chiri uwe di oké ọnu-ahia nke Isọ, bú nwa-ya nke-okenye nke di n'aka-ya n'ulo, ọ we yibe Jekob, bú nwa-ya nke-ntà: ọ chiri kwa akpukpọ umu-ewu ahu yibe ya n'aka-ya abua na n'olu-ya ebe aji nādigh: o nye Jekob, bú nwa-ya, nri utọ na achicha n'aka, bú nke o doziri. O we biakute nna-ya, si Nna m: ọ si, Lekwam; ònye ka i bu, nwam? Jekob we si nna-ya, Mu onwem bu Isọ ọkpara-gi; emewom dika i gwaram: biko, bilie, nọdu, rie ufọdu n'anu m'chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem. Aisak we si nwa-ya, Ì si kwa aṅa me ngwa ichọta ya, nwam? Ọ si, N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere ka o zutem. Aisak we si Jekob, Biko, bia nso, ka m'we bitu gi aka, nwam, ma gi onwe-gi bu nwam Isọ ahu, ma-ọbu na i bughi ya. Jekob we jekuru Aisak nna-ya nso; o bitu ya aka, si, Olu a bu olu Jekob, ma aka ndia bu aka Isọ. Ma ọ mataghi ya, n'ihi na aka-ya abua bu aji aji, dika aka Isọ nwa-nne-ya: o we gọzie ya. Ọ si, Gi onwe-gi, ì bu kwa nwam Isọ? Ọ si, Mu onwem bu ya. Ọ si, Buterem ya nso, ka m'ri kwa ufọdu nime anu nwam chutara, ka nkpuru-obim we gọzie gi. O we butere ya nso, o rie: o butekwara ya manya-vine, ọ nua. Aisak nna-ya we si ya, Biko, bia nso, sutum ọnu nwam. Ọ bia nso, sutu ya ọnu: o we nu ísi uwe-ya, gọzie ya, si, Le, ísì nwam Di ka ísi ọhia nke Jehova gọzi-woro: Ka Chineke nye gi ufọdu nime igirigi elu-igwe, Na ufọdu nime ebe di urù nke ala, Na ọka na manya-vine ọhu ri nne: Ka ndi di iche iche fè gi, Ka mba di iche iche kpọ isi ala nye gi: Buru onye nwere ike n'aru umunne-gi, Ka umu nke nne-gi kpọ kwa isi ala nye gi: Ka onye ọ bula nke nābu gi ọnu buru onye anābu ọnu, Ka onye ọ bula nke nāgọzi gi buru kwa onye agọziri agọzi. O rue, mb͕e Aisak gọzisiri Jekob, mb͕e Jekob nọ kwa nāpù n'iru Aisak nna-ya ub͕u a, na Isọ nwa-nne-ya siri n'ichu-ntá-ya bata. Ya onwe-yasi-kwa-ra nri utọ, butere nna-ya, si nna-ya, Ka nnam bilie, rie ufọdu nime anu nwa-ya chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem. Aisak nna-ya we si ya, Ònye ka i bu? Ọ si, Mu onwem bu nwa-gi, ọkpara-gi, bú Isọ. Aisak we ma jijiji nke-uku nke-uku, si Ònye kwa bu onye ahu nke chutaworo anu-nchuta, buterem, m'we rie ufọdu nime nri ahu nile tutu i bia, m'we gọzie ya? onye agọziri agọzi ka ọ gābu kwa. Mb͕e Isọ nuru okwu nna-ya ndia, o tie oké nkpu di ilu nke-uku, si nna-ya, Gọziem, ọbuná mu onwem, nnam. Ọ si, Nwa-nne-gi biara n'aghughọ, nara ngọzi-gi. Ọ si, Ọ̀ bu na akpọrọ aha-ya Jekob na o jidewom ikiri-ukwu ub͕ò abua ndia? ọnọdu-ọkparam ka ọ nara: ma, le, ub͕u a ka ọ naraworo ngọzim. Ọ si, Ọ̀ dighi ngọzi i debeworom? Aisak we za, si Isọ, Le, edowom ya onye nwere ike n'aru gi, ọ bu kwa umunne-ya nile ka m'nyeworo ya ka ha buru ndi-orù-ya; ewerewokwam ọka na manya-vine ọhu me ka o guzosie ike: gini kwa ka m'gēmere gi, nwam? Isọ we si nna-ya, Ọ̀ bu nání otú ngọzi ka i nwere, nnam? gọziem, ọbuná mu onwem, nnam. Isọ we welie olu-ya, kwa ákwá. Aisak nna-ya we za, si ya, Le, site n'ebe di urù nke ala ka ebe-obibi-gi gādi, Site kwa n'igirigi nke elu-igwe site n'elu; Ọ bu kwa mma-agha-gi ka i gēji di ndu, ọ bu kwa nwa-nne-gi ka i gēfe; O gēru kwa, mb͕e, i gālù, ulù, Na i gētijipu yoke-ya n'olu-gi. Isọ we kpọ Jekob asì n'ihi ngọzi ahu nke nna-ya gọziri ya: Isọ we si n'obi-ya, Ubọchi iru-újú bayere nnam nābiaru nso; m'gēb͕u kwa Jekob nwa-nnem. Ewe gosi Rebeka okwu ndia nke Isọ nwa-ya nke-okenye; o zìe, kpọ Jekob, bú nwa-ya nke-ntà, si ya, Le Isọ nwa-nne-gi nākasi onwe-ya obi bayere gi, nēzube ib͕u gi. Ma ub͕u a, nwam, ge nti n'olum; bilie, b͕akuru Leban, bú nwa-nnem nwoke, rue Heran; gi na ya nọ ubọchi ole-na-ole, rue mb͕e ọnuma nwa-nne-gi gālaghachi; rue mb͕e iwe nwa-nne-gi gēsi n'aru gi laghachi, ọ we chezọ ihe i meworo ya: m'gēziga kwa, si n'ebe ahu kulata gi: n'ìhi gini ka m'gēji kwa b͕ara aka unu abua, bú umum, n'otù ubọchi?