Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 26:17-35

JENESIS 26:17-35 IGBOB

Aisak we si n'ebe ahu je, ma-ulo-ikwū-ya na ndagwurugwu Gera, biri n'ebe ahu. Aisak we gwu kwa olùlù-miri nile ọzọ nke ha gwururi n'ubọchi Abraham nna-ya; n'ihi na ndi Filistia kpuchiri ha mb͕e ọnwu Abraham gasiri: ọ kpọ ha aha di ka aha nke nna-ya kpọrọ ha-ri. Ndi-orù Aisak we gwue na ndagwurugwu ahu, chọta olùlù-miri nāsuputa asuputa. Ndi-ọzùzù anu-ulo Gera we so ndi-ọzùzù anu-ulo Aisak nēse okwu, si, Ọ bu ayi nwe miri ahu: ọ kpọ aha olùlù-miri ahu Isek; n'ihi na ha chọrọ ya okwu. Ha gwue olùlù-miri ọzọ, se kwa okwu bayere ya: ọ kpọ aha-ya Sitna. O si n'ebe ahu kwapu, gwue olùlù-miri ọzọ; ma ha eseghi okwu bayere ya: ọ kpọ aha-ya Rehobot, si, N'ihi na ub͕u a Jehova enyewo ayi ebe sara mbara, ayi gamu kwa ọmùmù n'ala nka. O si n'ebe ahu rigorue Bia-sheba. Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'abali ahu, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham nna-gi: atula egwu, n'ihi na Mu na gi nọ, M'gāgọzi kwa gi, me ka nkpuru-gi ba uba n'ihi Abraham, bú orùm. Ọ we wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọkue aha Jehova, ma ulo-ikwū-ya n'ebe ahu: ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi-orù Aisak gwuru olùlù-miri. Abimelek we si na Gera jekuru ya, ya na Ahuzat, bú eyì-ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya. Aisak we si ha, Gini mere unu ji biakutem, ebe unu onwe-unu nākpọm asì, we si n'ebe unu nọ zilagam? Ha si, Ayi ahuwo nke-ọma na Jehova nọyere gi: ayi we si, Biko, ka iṅu-iyi di n'etiti ayi, bú n'etiti ayi na gi, ka ayi na gi b͕a kwa ndu; na i gaghi-eme ayi ihe ọjọ ma-ọli dika ayi nēmetughi gi aka na dika ayi meworo gi nání ezi ihe, ayi we zilaga gi n'udo: ub͕u a gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi nke Jehova. Ọ we mere ha oké oriri, ha rie ṅu kwa. Ha bilie n'isi-ututu, ṅuritara onwe-ha iyi: Aisak we zilaga ha, ha si n'ebe ọ nọ la n'udo. O rue n'ubọchi ahu, na ndi-orù Aisak biara, kọrọ ya akukọ bayere olùlù-miri ahu nke ha gwuru, si ya Ayi achọtawo miri. Ọ kpọ ya Shiba: n'ihi nka aha obobo ahu bu Bia-sheba rue ta. Mb͕e Isọ b͕ara ọgu arọ abua ọ luru Judit na nwunye, bú nwa-nwayi Beiri onye Het, ya na Basemat, bú nwa-nwayi Ilon onye Het: ha we ghọrọ Aisak, ghọkwara Rebeka, ihe mọ-ilu.