JENESIS 25:22-26
JENESIS 25:22-26 IGBOB
Umu-ya we b͕a nb͕a nime afọ ya; ọ si, Ọ buru na ọ di otú a, n'ìhi gini kwa ka mu onwem di ndu? Ọ we je iju Jehova ase. Jehova we si ya, Mba abua di n'afọ-gi, Agēkewa kwa mba abua site n'úkwù-gi; Otù mba gēnwe ume kari mba ibe-ya; Nke-okenye gēfè nke-ntà. Ubọchi-ya we zue imu nwa, ma, le, umu abua di n'afọ-ya. Nke-mbu we puta nācha ọbara ọbara, aru-ya nile di ka uwe aji; ha we kpọ aha-ya Isọ. Emesia nwa-nne-ya nwoke puta-kwa-ra, aka-ya nējide ikiri-ukwu Isọ; ewe kpọ aha-ya Jekob: Aisak b͕ara ọgu arọ atọ mb͕e Rebeka muru ha.

