Jehova, bú Chineke, we kua ubi nke ab͕ara ogige n'Iden, n'Iru-anyanwu; O we tinye madu ahu n'ebe ahu, bú onye Ọ kpururi. Jehova, bú Chineke, we me ka osisi nile ọ bula si n'ala pue, bú nke anāchọsi ike n'ile anya, nke di kwa nma ihe-oriri; osisi nke ndu dikwa n'etiti ubi ahu ab͕ara ogige, na osisi nke ima ezi ihe na ihe ọjọ. Osimiri nēsi kwa n'Iden puta idè ubi ahu ab͕ara ogige miri; ewe site n'ebe ahu kewa ya, ọ we ghọ isi miri anọ. Aha osimiri nke-mbu bu Paishon: nke ahu bu nke nāga ala Havila nile gburugburu, ebe ọla-edo di; ọla-edo ala ahu di nma: n'ebe ahu ka bdellium na nkume onyx di. Aha osimiri nke-abua bu Gaihon: nke ahu bu nke nāga ala Etiopia nile buruburu. Aha osimiri nke-atọ bu Hidekel: nke ahu bu nke nāga Asiria n'Iru-anyanwu. Osimiri nke-anọ bu Yufretis. Jehova, bú Chineke, we were madu ahu me ka ọ nọdu n'ubi Iden ab͕ara ogige ilu ọlu-ya na idebe ya. Jehova, bú Chineke, we nye madu ahu iwu, si, Nkpuru nke sitere n'osisi nile ọ bula nke ubi a ab͕ara ogige ka i ganēri eri: ma nkpuru nke sitere n'osisi ima ezi ihe na ihe ọjọ, gi erila nkpuru sitere na ya: n'ihi na n'ubọchi i gēri nkpuru sitere na ya i ghaghi inwu anwu.
Gụọ JENESIS 2
Geere nke a ntị JENESIS 2
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 2:8-17
3 Ụbọchị
Ma ị lụọla di maọbụ nwunye maọbụ na ị ka chọrọ ịlụ alụ, atụmatụ ịgụ akwụkwọ ụbọchị atọ a ga-enyere gị aka ịchọpụta ezigbo atụmatụ Chineke maka ofufe nrù ndụ niile nke di na nwunye. Mụta ka esi ele enyo ịhụnanya Jizọs nwere maka nwunye ya, bụ Nzukọ nsọ, site n'ịchọgharị isiokwu nke mmekọrịta, ịmụ nnwa, mkpọsa, ịdị ọcha na ihe ụtọ.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị