Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 2:1-17

JENESIS 2:1-17 IGBOB

Ewe kesia elu-igwe na uwa, na usu-ha nile. Chineke we jesia ozi-Ya n'ubọchi nke-asa, bú nke O jere; O we kwusi n'ubọchi nke-asa ahu n'ozi-Ya nile nke O jere. Chineke we gọzie ubọchi nke-asa ahu, do kwa ya nsọ: n'ihi na ọ bu nime ya ka Ọ kwusiri n'ozi-Ya nile nke Chineke kereri ekè n'ije ya. Ndia bu usoro okike elu-igwe na uwa mb͕e ekere ha, n'ubọchi ahu mb͕e Jehova, bú Chineke, mere uwa na elu-igwe. Ma osisi ntà ọ bula nke ọhia akādighi n'uwa, ihe-ọkukú ọ bula nke ọhia akēpughi kwa: n'ihi na Jehova, bú Chineke, akēmeghi ka miri zo n'elu uwa, ọ dighi kwa madu di ilu ọlu ubi; ma alulu nēsi n'ala kwugo n'elu, nēdè kwa iru nile nke ala miri. Jehova, bú Chineke, we were ájá sitere n'ala kpuọ madu, O we kuo ume ndu nye n'oghere-imi-ya abua; madu ahu we ghọ nkpuru-obi di ndu. Jehova, bú Chineke, we kua ubi nke ab͕ara ogige n'Iden, n'Iru-anyanwu; O we tinye madu ahu n'ebe ahu, bú onye Ọ kpururi. Jehova, bú Chineke, we me ka osisi nile ọ bula si n'ala pue, bú nke anāchọsi ike n'ile anya, nke di kwa nma ihe-oriri; osisi nke ndu dikwa n'etiti ubi ahu ab͕ara ogige, na osisi nke ima ezi ihe na ihe ọjọ. Osimiri nēsi kwa n'Iden puta idè ubi ahu ab͕ara ogige miri; ewe site n'ebe ahu kewa ya, ọ we ghọ isi miri anọ. Aha osimiri nke-mbu bu Paishon: nke ahu bu nke nāga ala Havila nile gburugburu, ebe ọla-edo di; ọla-edo ala ahu di nma: n'ebe ahu ka bdellium na nkume onyx di. Aha osimiri nke-abua bu Gaihon: nke ahu bu nke nāga ala Etiopia nile buruburu. Aha osimiri nke-atọ bu Hidekel: nke ahu bu nke nāga Asiria n'Iru-anyanwu. Osimiri nke-anọ bu Yufretis. Jehova, bú Chineke, we were madu ahu me ka ọ nọdu n'ubi Iden ab͕ara ogige ilu ọlu-ya na idebe ya. Jehova, bú Chineke, we nye madu ahu iwu, si, Nkpuru nke sitere n'osisi nile ọ bula nke ubi a ab͕ara ogige ka i ganēri eri: ma nkpuru nke sitere n'osisi ima ezi ihe na ihe ọjọ, gi erila nkpuru sitere na ya: n'ihi na n'ubọchi i gēri nkpuru sitere na ya i ghaghi inwu anwu.