Ndikom ahu we si n'ebe ahu bilie, le anya n'ebe Sọdọm di: Abraham nēso kwa ha je idupu ha. Jehova we si, Mu onwem, M'nēzonari Abraham ihe Mu onwem nēme; ebe Abraham nāghaghi ighọ mba di uku nwe kwa ume, agāgọzi kwa mba nile nke uwa nime ya? N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya. Jehova we si, Iti-nkpu Sọdọm na Gọmọra, o riri nne n'ezie, nmehie-ha kwa, ọ di arọ́ nke-uku n'ezie; ka M'rida kwa, hu ma ọ bu dika iti-nkpu ya si di, nke rurum nti, ka ha mezuworo; ọ buru kwa na ọ dighi otú a, ka M'mara. Ndikom ahu we si n'ebe ahu che iru je n'uzọ Sọdọm: ma Abraham nēguzogide n'iru Jehova.
Gụọ JENESIS 18
Geere nke a ntị JENESIS 18
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 18:16-22
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị