Chineke we si Abraham, Gi onwe-gi kwa, i gēdebe ọb͕ub͕a-ndum, gi onwe-gi, na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile. Nka bu ọb͕ub͕a-ndum, nke unu gēdebe, nke di n'etiti Mu na unu na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi; agēbì nwa-nwoke ọ bula n'etiti unu úgwù. Agēbì unu úgwù n'anu-aru nke apí-unu; ọ gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na unu. Agēbì onye ruru ubọchi asatọ úgwù n'etiti unu, nwa-nwoke ọ bula rue ọb͕ọ-unu nile, onye amuru n'ulo, na onye eji ego b͕ata n'aka onye ala ọzọ ọ bula, nke nēsighi na nkpuru-gi puta. Aghaghi ibì onye amuru n'ulo-gi, na onye eji ego-gi b͕ata, úgwù: ọb͕ub͕a-ndum gādi kwa n'anu-aru-unu ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi. Ma nwoke anēbighi úgwù, nke anēbighi úgwù n'anu-aru nke apí-ya, agēbipu nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya; ọ mebiwo ọb͕ub͕a-ndum. Chineke we si Abraham, Serai, bú nwunye-gi, i gaghi-akpọ aha-ya Serai, n'ihi na Sera bu aha-ya. M'gāgọzi ya, ọzọ kwa, M'gēnye gi nwa-nwoke site na ya: M'gāgọzi kwa ya, ọ gāghọ kwa mba di iche iche; ndi-eze nke ndi di iche iche gēsite na ya di.
Gụọ JENESIS 17
Geere nke a ntị JENESIS 17
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 17:9-16
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo