Mọ-ozi nke Jehova we hu ya n'akuku isi-iyi miri ahu di n'ọzara, n'akuku isi-iyi ahu di n'uzọ Shua. Ọ si, Hega, nwayi nējere Serai ozi, òle ebe i siri bia? ọ̀ bu kwa ole ebe i nēje? Ọ si, Ọ bu n'iru Serai, bú nwayi-nwem, ka m'nāb͕apu. Mọ-ozi nke Jehova we si ya, Laghachikuru nwayi-nwe-gi, weda kwa onwe-gi ala n'okpuru aka-ya. Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, M'gēme ka nkpuru-gi ba uba nke-uku, agaghi-aguta kwa ya n'ihi ọtutu ọ di. Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, Le, gi onwe-gi di ime, i gaje imu nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-ya Ishmael, n'ihi na Jehova egewo nti na nweda-gi. Ya onwe-ya gābu kwa madu yiri inyinya-ibu-ọhia; aka-ya gēmegide madu nile ọ bula, aka madu nile ọ bula gēmegide kwa ya; ọ bu kwa n'iru umu-nne-ya nile ka o gēbi. Ọ we kpọ aha Jehova Nke nāgwa ya okwu, Gi onwe-gi bu Chineke nāhu uzọ: n'ihi na ọ siri, Ọ̀ bu kwa n'ebe a ka m'leworo azu Onye nāhum anya? N'ihi nka ka akpọrọ ólùlù-miri ahu Bia-lahai-roi; le, ọ di n'etiti Kedesh na Bered. Hega we muara Abram nwa-nwoke: Abram we kpọ aha nwa-ya nwoke, nke Hega muru, Ishmael. Abram b͕ara ọgu arọ anọ na isi, mb͕e Hega muru Ishmael nye Abram.
Gụọ JENESIS 16
Geere nke a ntị JENESIS 16
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 16:7-16
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo