Ma Serai, bú nwunye Abram, amughi nwa nye ya: ma ọ nwere otù nwayi nējere ya ozi, bú onye Ijipt, onye aha-ya bu Hega. Serai we si Abram, Biko, le, Jehova eb͕ochiwom imu nwa; biko, bakuru nwayi nējerem ozi; eleghi anya agēsite na ya wuliem elu dika ulo. Abram we ge nti n'olu Serai. Serai, bú nwunye Abram, we were Hega, bú onye Ijipt, bú nwayi nējere ya ozi, nye Abram, bú di-ya, na nwunye, n'ọgwugwu arọ nke-iri Abram biri n'ala Kenean. O we bakuru Hega, o we turu ime: o we hu na ọ turu ime, ewe leda nwayi-nwe-ya n'anya-ya. Serai we si Abram, Ihe-ikem di n'aru gi: mu onwem nyere nwayi nējerem ozi n'obi-gi; o we hu na ọ turu ime, ewe ledam n'anya-ya: ka Jehova kpe ikpe n'etiti mu na gi. Abram we si Serai, Le, nwayi nējere gi ozi di n'aka-gi; me ya ihe di nma n'anya-gi. Serai we weda ya ala, o we b͕apu n'iru-ya.
Gụọ JENESIS 16
Geere nke a ntị JENESIS 16
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: JENESIS 16:1-6
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo