Uwa nile we nwe otù asusu na otù uzọ okwu. O rue, mb͕e ha buliri ije n'Iru-anyanwu, na ha chọtara ala di lari n'ala Shaina; ha we biri n'ebe ahu. Ha we sirita ibe-ha, Ngwa, ka ayi kpua brick, kpọ ha ọku nke-ọma. Ha we nwe "brick'' n'ọnọdu nkume, ọ bu kwa bitumen ka ha nwere n'ọnọdu urọ. Ha we si, Ngwa, ka ayi wuere onwe-ayi obodo, na ulo-elu, nke elu-ya gēru n'elu-igwe, ka ayi mekwara onwe-ayi aha; ka ayi we ghara ib͕asa n'elu uwa nile. Jehova we ridata ihu obodo ahu na ulo-elu ahu, nke umu madu wuru. Jehova we si, Le, ha bu otù ndi, ọ bu kwa otù asusu ka ha nile nwere; nka bu kwa ihe ha nāmalite ime: ub͕u a agaghi-eb͕ochiri ha ihe ọ bula nke ha nēzube ime. Ngwa, ka ayi rida, ghagbue asusu-ha n'ebe ahu, ka ha we ghara inurita asusu ibe-ha. Jehova we me ka ha si n'ebe ahu b͕asa n'elu uwa nile: ha we rapu iwu obodo ahu. N'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Bebel; n'ihi na n'ebe ahu ka Jehova ghab͕uru asusu uwa nile: ọ bu kwa n'ebe ahu ka Jehova mere ka ha si b͕asa n'elu uwa nile.
Ndia bu usoro-ọmumu Shem. Shem b͕ara ọgu arọ ise, mua Apakshad arọ abua ka iju-miri ahu gasiri: Shem di ndu, mb͕e ọ musiri Apakshad, nnù arọ na ọgu ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
Apakshad di ndu orú arọ na iri na ise, mua Shela: Apakshad di ndu, mb͕e ọ musiri Shela, nnù arọ na atọ, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
Shela di ndu orú arọ na iri, mua Iba: Shela di ndu, mb͕e ọ musiri Iba, nnù arọ na atọ, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
Iba di ndu orú arọ na iri na anọ, mua Peleg: Iba di ndu, mb͕e ọ musiri Peleg, nnù arọ na orú na iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
Peleg di ndu orú arọ na iri, mua Reu: Peleg di ndu, mb͕e ọ musiri Reu, ọgu arọ iri na arọ iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
Reu di ndu orú arọ na iri na abua, mua Serug: Reu di ndu, mb͕e ọ musiri Serug, ọgu arọ iri na arọ asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
Serug di ndu orú arọ na iri, mua Nehoa: Serug di ndu, mb͕e ọ musiri Nehoa, ọgu arọ iri, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
Nehoa di ndu orú arọ na iteghete, mua Tira: Nehoa di ndu, mb͕e ọ musiri Tira, ọgu arọ ise na iri na iteghete, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
Tira di ndu ọgu arọ atọ na iri, mua Abram, na Nehoa, na Heran.
Ma ndia bu osuso-ọmumu Tira. Tira muru Abram na Nehoa na Heran; Heran muru Lot. Heran we nwua n'iru nna-ya Tira n'ala amuru ya, n'Ua nke ndi Kaldea. Abram na Nehoa we lutara onwe-ha nwunye; aha nwunye Abram bu Serai; aha nwunye Nehoa bu Milka, nwa-nwayi Heran, bú nna Milka na nna Iska. Ma Serai bu nwayi-àgà; ọ dighi nwa ọ nwere. Tira we chiri Abram, bú nwa-ya nwoke, na Lot, bú nwa-nwoke nke Heran, ya bu nwa nwa-ya, na Serai, bú nwunye nwa-ya, bú nwunye Abram nwa-ya nwoke; ha na ha we si n'Ua nke ndi Kaldea pua, ije ala Kenean; ha biarue Heran, biri n'ebe ahu. Ubọchi nile nke Tira we buru ọgu arọ iri na arọ ise: Tira we nwua nime Heran.