Umu-ndikom Ham kwa; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean. Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan. Kush muru Nimrod; onye ahu malitere ibu dike n'uwa. Ya onwe-ya bu dike n'ichu-ntá n'iru Jehova: n'ihi nka ka anāsi, Dika Nimrod, bú dike n'ichu-ntá n'iru Jehova. Nmalite ala-eze-ya bu Bebel, na Erek, na Akad, na Kalne, n'ala Shaina. O siri n'ala ahu pua je Asiria, wue Nineve, na Rehobot-Ia, na Kala, na Resen n'etiti Nineve na Kala (nke ahu bu obodo uku ahu). Mizraim muru Ludim, na Anamim, na Lehabim, na Naftuhim, na Patrusim, na Kasluhim (ebe ndi Filistia siri puta), na Kaftorim.
Kenean muru Zaidon, bú ọkpara-ya, na Het; na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait; na ndi-Haivait, na ndi Aka, na ndi Sin; na ndi Avad, na ndi Zemar, na ndi Hemat: emesia ab͕uru nile nke ndi Kenean we b͕asa. Ókè-ala nke ndi Kenean we buru site na Zaidon, mb͕e i nēje Gera, rue Geza: mb͕e i nēje Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, rue Lesha. Ndia bu umu-ndikom Ham, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n'ala nile ha, nime mba nile ha.