Ma mb͕e okwukwe akābiaghi, anēche ayi nche n'okpuru iwu, ebe anēmechibido ayi rue okwukwe ahu nke agaje ikpughe. Ya mere iwu ahu aghọwo onye-ozìzí-ayi ikpọrọ ayi biakute Kraist, ka ewe site n'okwukwe gua ayi na ndi ezi omume. Ma ebe okwukwe ahu biaworo, ayi anọghi ọzọ n'okpuru onye-ozizí. N'ihi na unu nile bu umu Chineke, site n'okwukwe, nime Kraist Jisus. N'ihi na ka unu ra, bú ndi emere baptism ibà nime Kraist, unu yikwasiri Kraist. Onye-Ju ma-ọbu onye-Grik apughi idi, orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya apughi idi, nwoke na nwanyi apughi idi: n'ihi na unu onwe-unu nile bu otù onye nime Kraist Jisus. Ma ọ buru na unu onwe-unu bu ihe di n'aru nke Kraist, ya mere unu bu nkpuru Abraham, buru ndi-nketa dika nkwa si di.
Gụọ NDI GALETIA 3
Geere nke a ntị NDI GALETIA 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI GALETIA 3:23-29
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo