Ma ndi Galetia nēnweghi uche, ònye riri obi-unu, ndi ewere Jisus Kraist gosi ọra madu n'anya-unu, dika Onye akpọgidereri n'obe? Náni nka ka m'nāchọ imata n'ọnu-unu, Ùnu sitere n'ọlu di iche iche nke iwu nata Mọ Nsọ, ma-ọbu na unu sitere n'ọnunu nke okwukwe nata Ya? Ùnu bu ndi nēnweghi uche otú a? ebe unu malitere na Mọ Nsọ, ọ̀ bu n'anu-aru ka anēme ka unu zue okè ub͕u a? Ùnu huru ọtutu ahuhu di otú a n'efu? ma asi na ọ bu ezie na unu huru ha n'efu. Ya mere Onye ahu Nke nwe inyezu unu Mọ Nsọ, Nke nāluputa kwa ọlu di ike nime unu, Ò sitere n'ọlu di iche iche nke iwu ma-ọbu na o sitere n'ọnunu nke okwukwe nēme ya? Dika Abraham kwere Chineke, ewe gua nke ahu nye ya n'ezi omume. Ya mere maranu na ndi sitere n'okwukwe, ndi ahu bu umu Abraham. Ma ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ebe o buru uzọ hu na Chineke nēsite n'okwukwe gu ndi mba ọzọ na ndi ezi omume, o buru uzọ zìe Abraham ozi ọma, si, Agāgọzi mba nile nime gi. Ya mere ndi sitere n'okwukwe, ndia ka anāgọzi, ha na onye okwukwe ahu, bú Abraham.
Gụọ NDI GALETIA 3
Geere nke a ntị NDI GALETIA 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI GALETIA 3:1-9
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo