Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI GALETIA 1:10-24

NDI GALETIA 1:10-24 IGBOB

N'ihi na ọ̀ bu madu ka m'nēme ka ha kweye ub͕u a, ma-ọbu Chineke? ma-ọbu ànamachọ uzọ ime ihe gātọ madu utọ? ọ buru na anọm nēme ihe gātọ madu utọ, m'gaghi-abuwori orù nke Kraist. N'ihi na emem ka unu mara, umu-nnam, na ozi ọma m'zisara, na ọ bughi nke mmadu chèputara. N'ihi na mu onwem anataghi kwa ya site na madu, ọ dighi kwa onye zírim ya, kama a nuru m site na nkpughe nke Jisus Kraist. N'ihi na unu nuru ihe bayere ibi-obim n'oge gara aga n'uzọ ndi-Ju, na anamesob͕u nzukọ Chineke nke-uku ri nne, mebi kwa ya: anamaga-kwa-ri n'iru n'uzọ ndi-Ju kari ọtutu ndi-ọb͕ọm n'etiti mba nkem, ebe obim nānubigara ozizí ahu ọku ókè kari, bú nke nnam-hà nyere ayi n'aka idebe. Ma mb͕e ọ di Chineke ezi nma, bú Onye sitere n'oge m'nọ n'afọ nnem kewaputam, site kwa n'amara-Ya kpọm, mb͕e ọ di Ya ezi nma ikpughe Ọkpara-Ya nimem, ka m'we zisa ozi ọma Ya n'etiti ndi mba ọzọ; ngwa ngwa mu na anu-aru na ọbara ab͕aghi ìzù: arigoghm kwa na Jerusalem jekuru ndi burum uzọ buru ndi-ozi: kama ejerem Arebia; we laghachi na Damaskọs ọzọ. Mb͕e ahu mb͕e arọ atọ gasiri arigorom na Jerusalem ileta Kifas, mu na ya we nọgide ubọchi iri na ise. Ma ahughm onye ọzọ n'etiti ndi-ozi, ma ọ bu nání Jemes nwa-nne Onye-nwe-ayi. Ma ihe ndia nke m'nēdegara unu, le, n'iru Chineke, na ekwughm okwu-ugha. Mb͕e ahu abiarurum akuku nile Siria na Silisia. Ma nzukọ nile nke Judia nke di nime Kraist nọ nāmaghi irum: ma ọ bu nání na ha nānu, si, Onye ahu nke nēsob͕u ayi n'oge gara aga, ọ nēzì ozi ọma ub͕u a nke okwukwe ahu nke ọ nēmebi n'oge gara aga; ha we nēnye Chineke otuto n'ihe ha huru n'arum.